Tonto Dikeh: Ọ bụghị eziokwu na anyị nyere nwa ada a ọkwa 'Ambassador" - NCPC

Tonto Dikeh

Ebe foto si, Tonto Dikeh/Instagram

Nkọwa foto,

Tonto Dikeh na onyeisi ngalaba NCPC bụ Yakubu Pam

"Tonto Dikeh abụghị 'ambassador' anyị, onweghị mgbe anyị ji nye ya ọkwa dị otu a."

Nke a bụ okwu si n'ọnụ Celestine Oguguo Toruka, onye isi mgbasa ozi na ngalaba gọọmentị a kpọrọ 'National Christian Pilgrims Commission'.

Celestine Oguguo kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC Igbo n'ụtụtụ Satọde gbasara akụkọ na-ewu na soshal midia ugbua nke na-ekwu na Tonto Dikeh, nwa ada na-eme ejije Nollywood, enwetala ọkwa 'Ambassador' nke udo n'aka ụlọọrụ NCPC.

Etu akụkọ a si malite

Ebe foto si, Twitter Screengrab

Tonto Dikeh dere n'akara soshal midia ya dị icheiche na ya abụrụla onye na-anọchite anya ngalaba NCPC n'ịkpa udo.

Ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ dị icheiche buru ya bụ akụkọ, nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji malite ịkatọ ya bụ ihe.

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto,

Mark Amaza na-ajụ ihe kpatara e ji hapụ ndị otu Kraịst a ma ama, họrọ Tonto Dike dịka onye nnọchite anya NCPC

Lee ihe NCPC kwuru

Celestine Oguguo Toruka, onyeisi mgbasa ozi na NCPC gwara BBC Igbo na ya bụ akụkọ abụchaghị eziokwu.

O kwuru na Tonto Dikeh nakwa ụlọọrụ ya bụ 'Tonto Dikeh Foundation' bịara njem nleta n'isi ụlọọrụ NCPC dị n'Abuja, mana onweghị mgbe e ji nye ya ọkwa ọbụla ma ya fọkwa 'ambassador'.

Ebe foto si, NCPC

Nkọwa foto,

Yakubu Pam bụ onyeisi ngalaba NCPC

"Ọbụghị NCPC kpọrọ ya oku ka ọ bịa, ọ bụ ya na ndị ụlọọrụ ya bịara we kwuo na ọ ga-amasị ha ịkwado ọrụ anyị," Celestine Toruka na-ekwu.

"Tonto Dikeh kwuru na ọ ga-akwado mmadụ iri ka ha soro gaa njem n'ala nsọ n'afọ a. O kwukwara na ọ ga-akwado mbọ NCPC na-agba iweta udo na Naịjirịa."

"Onyeisi NCPC bụ Yakubu Pam nabatara ihe o kwuru ma kweta na ụlọọrụ anyị na ụlọọrụ ga-ejikọ aka n'ọrụ ụfọdụ anyị na-arụ."

Celestine Toruka gara n'ihu kwuo na ọ gbara ya gharịị ịhụ na soshal midia ebe Tonto na-ekwu na e nyere ya ọkwa Ambassador. "Nke a abụghị eziokwu."

Ihe Tonto Dikeh kwuru

Ebe foto si, Instagram

Mana Tonto Dikeh na-ekwusi ike na NCPC nyere ya ọkwa Ambassador.

N'akara Instagram ya, o wepụtara ozi nke na-ekwu na ọ bụ ndị mmadụ gbara mgba okpuru mere e ji napụ ya ọkwa ahụ.

Tonto kwuru na ya agaghị asịgide mmadụ maọbụ ụlọọrụ ọbụla asị.

O kwukwara na ya nwere ihe onyonyo iji gbaa akaebe maka ihe ọ na-ekwu, mana ọ gaghị ewepụta ya.