Igbo Customs and tradition: Ihe ndị Igbo kwenyere ga-eme ma mmadụ zute anụmanụ ndị a

Ụmụ anụmanụ

Ebe foto si, Getty Images

Obodo dị iche iche n'ala Igbo nwere nkwenye ha kwenyere gbasara ụfọdụ ụmụ anụmanụ.

Ọtụtụ nkwenye ndi a bụ ihe a na-akpọ Ụchi nke bekee na-akpọ "Premonition" ebe nke ọzo bụ Nkwenyeasi nke Bekee na-akpọ "superstitious beliefs".

BBC Igbo na Mazi Chigozie Nnabuihe nwere mkparịta ụka ebe ọ kọwaara anyị ụfọdụ nkwenye ndị a.

Mazi Nnabuihe bụ onye nkuzi ma bụru kwa ọkammụta n'ihe gbasara asụsu Igbo na Omenala Igbo na Mahadum nke Legọs.

Lee ihe ndị ọ rụtụrụ aka na mkaparịta ụka ahụ:

Udele:

Mazị Nnabuihe kọwara na ọtụtụ mba n'ala Igbo nwere nkwenye na onye njem Udele nyụsara nsi n'ahụ, na ihe ọma chere onye ahụ n'ihu.

O kọwara sị, " Igbo kwenyekwara na mgbe udele besara n'elu ụlọ mmadụ na ọdachi ọkachasi ọnwu nwereike ime n'ụlọ onye ahụ".

Kwaafọkwaọnwụ maọbụ Ajikwụ, nnụnụ obe fịọfịọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nnabuihe kwuru maka edemde ode akwụkwọ Wiliam Shakespear dere ebe ọ kwuru maka nnụnụ ọ kpọrọ "Bird of the Night" ebe ndị ọzọ na-akpọ ya "Ill-Ominous-Bird".

Ọ kọwara na ihe edemde ejije Shakespear dere kwuru na ya bụ nnụnụ na-ekwu na ọdachi ga-eme.

Kama Igbo nwere aha dị iche iche a na-akpọ ya bụ nnụnụ.

O kwuru sị, "Ube nnụnụ a na-atụ ụjọ na ntị ma ndị igbo kwenyere na mgbe ọbụla ọ bere nna okenye maọbụ dimkpa ga-anwụ n'akụkụ ụlọ ahụ ọ bere ".

Obu nke bụ "sparrow" n'asụsụ Bekee

Ebe foto si, Getty Images

Mazi Nnabuihe kwukwara si "Ụfọdụ ndị n'ala Igb kwenyere na mgbe mmadụ na-eme njem, nnụnu a bee n'aka nrị na ihe ọma chere onye ahụ kama ọ bee n'aka ekpe ya, ọdachi chere onye ahụ".

Ijere maobu Erughieru

Ebe foto si, Getty Images

Ijere nke bekee na-akpọ Soldier Ant nwekwara nkwenye ndị igbo kwenyere maka ya.

Nnabuihe kwuru si, " mgbe Ijere kpụrụ n'ite ofe mmadụ nke mere na agaghị eri nrị ahụ ọzọ, ọ bụ uchi ndi Igbo kwnyere na ajọ ihe na-akwado ime".

O kwukwara si na mgbe ijere a metutara ozu mmadụ, na ndị Igbo kwenyere na onye ahụ gwọrọ nsii oge ọ di ndụ.

Aṅụ

Ebe foto si, Getty Images

Nnabuihe kwuru si, "Ụfọdụ ebe n'ala Igbo nwere na mgbe aṅụ kpụrụ n'ụlommadụ n'ehihe na ọ pụtara na onye ahụ ga-enwe ndị ọbịa".

O kwukwara na ụfọdụ nwere nkwenyeasị na mgbe anụ febatara ma fepụwak n'ụlo mmadụ na onye ahụ ga-enwe onye ọbịa.

Agwọ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Onye ọbụla gburu eke n'obodo a na-asọ ya na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ

(Eke; ụfọdu ndi anaghi egbu ya n'ala Igbo)

Mazi Nnabuihe kọwara na-enweghị ihe o pụtara ma mmadụ zute agwọ.

O kwuru sị " N'ụfọdụ ebe n'ala Igbo, mgbe agwọ bịara nogide nwa enyiwere n'ala, ha na aṅụrị na onye na-elekọta nwa abịala".

O kwukwara si, enwere nkwenyeasị nke igbo kwenyere na ekwesịghị ikpọ agwọ aha ya n'abali.

O kwuru sị, " Onye kpọro agwọ aha ya n'abali ga-ahụta agwọ kama ka onye ahu kpọọ ya eriri".

Kedụ ihe ndị Sayensi chere maka uchi na nkwenyeasi ndị a?

(Dokinta na-enyocha anumanụ)

Dokịta na-ahụ maka ahuike ụmụ anụmanụ bụ Ugwu Obinna kọwara na Sayensi akwadoghi nkwnyeasi n'ihi na ha kwenyere na ihe nani na ihe enwereike inyocha maọbụ hazie na laabụ nke ga-enwe mpụtara ka ha na-akwado.

O kwuru sị, " Ọ bụ ndị obodo kwenyere na nkwenyasị ndi a".

Ugwu mara atu sị, " O bụru na nkita na-aga ebe ọ na amaghị, ọ ga-anyụsa mammiri n'ụzọ nke nwere 'pheromone' . O bu ya ka nkịta ga-ejii mata ụzo lọghachi. Nke a bụ mpụtara nke ndị sayensi ji nyocha were hu na o bu eziokwu".