Security in Anambra: Ndi ọrụ nchekwa ụlọọkpọrọ Naijirịa bụ NCS n'ịchafụ ewepụtala ihu nwaadị ahụ ha sị na ndị omekome zọpụtara na mkpa mkpa kpara n'Ekwulobia

Chidi Nwankwo

Ebe foto si, Nigeria Correctional Service

Ndị ọrụ nchekwa ụlọmkpọrọ Naịjirịa bụ Nigeria Correctional Service ewepụtala foto onye ha sị mere e jiri gbagbuo onye ọrụ ha na onye uweojii nwaanyị ụbọchị Satọde n'Ekwuruobia dị n'Anambra steeti.

Ha gosiri aha ya bụ nwaamadị dịka Chidi Nwakwo gbara afọ iri anọ n'isii akara njiri mara ya bụ C/No:28/2021 bụ onye ana ekpe ikpe nwereike ibutere ya ọnwụ bụ nke Bekee kpọrọ "felony".

Aka ndị ọrụ nchekwa kpaara ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachi na-ekpe ya ikpe na ụlọikkpe Majistrati Kọtụ di na Nnaka,

Ka ọ dị ugbua ha sị na-ana achọ ya bụ nwaamdị achọ.

Ihe Gọvanọ Anambra steeti kwuru maka mkpa mkpa na akpa na steeti ahụ

Ebe foto si, ASG

N'okwu ya taa bụ sọnde, Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano katọrọ ya bụ mwakpo ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ nke ọ sị jọgburu udele ma sigbuo nkakwu.

Ọ sịkwa na, ewezụga ndị nke mere abalị atọ gara aga, na ndị omekome ahụ gbalịkwara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'ụtụtụ a mana ndị ọrụ nchekwa napụrụ ha ike.

Obiano sị na kemgbe ya bụ mkpamkpa malitere ma ya akpọọla nzụkọ ndị isi ọrụ nchekwa ugboro abụo ma kpọkwasịkwa ọzọ taa, nke ha na ndị nche obodo ịmata ụzọ ka mma aga eji akwọ onye ukwu wara.

Ọ tara ikikiri eze kwuo na gọọmentị ya ga-eme ihe niile o nwere ike ịme ịhụ na ha meriri ndị ajọ mmadụ a na-agbasa steeti ahụ mgba site ịwakpọ ndị ọrụ nchekwa.

Ọ sị na-eziterela ha ọtụtụ ndị agha, ndị uweojii, ndị agha ime mmiri na ndị ọrụ nchekwa mgba ama bụ ndị ga-enyeaka pịṅụọ ya bụ ọkụ.

Ọ sị na esitela ụzọ kpọkụọ "ndị ọrụ nchekwa niile, ma nke ndị nche ime obodo Bekee kpọrọ "vigillante" ka ha kulie kee nkwụcha maka ọrụ cheere ha n'ihu". "akpọkụkwaa m ndị obodo, ụmụ ntorobia,ndị ọchịchị obodo dị iche iche na ndị ahịa niile sị ha na o ruo n'omume".

Obiano ji ohere a na-akpoku ndị ndị Eze Ọdịnala niile na ndị Anambra steeti niile ka ha tinye aka maka ọrụ nchekwa obodo.

Maka ndị otu nzuzo

Obiano kwukwara na ndị uweojii ejidala mmadụ atọ n'ime ndị gbupuru otu nwaamadị isi bụ nke na-efegharị na soshal midia ụnyaahụ.

Ọ sịkwa na ha ga-ejidekwa ndị isi ha mgbe adịghị anya taa ahụhụ ka o kwesiri

Obiano sị na ya amachiela otu nzuzo niile na steeti ahụ.

Ọ sị na gọomentị ya agaghịzị nabata ajọ agwa sitere n'otu nzụzọ ma rịọkwa ụmụntorobia ka ha kpachapuru onwe ha anya, chegharịa ma chigharịa.

O sịkwa na ya amachiela ọrụ agboro niile na steeti ahụ, ọkachasị n'Ọnịcha, ma nye ndị ọrụ nchekwa ikike ịnwuchị onye ọbụla ha huru kpụ osisi amaja ndị mmadụ n'ụzọ.

"Nke ahụ ga-ebi ozugbo".

Maka onyeisioche ndị Omor ndị ntọ gburu

Maka onyeisioche ndị Omor dị n'Okpuruọchịchị Ayamelum Obiano sị "Obi dị m ilu ka ndị ntọ siri tọrọ ya bụ nwaamadị na napụta ndụ ya n'ike".

Ọ sị na mgbe ya bụ ihe mere na gọomentị na ndị obodo nwere ike ha ịzọpụta ya na ndụ mana ndị omekome ahụ kachiri ntị gbuo ya n'ọhịa gbalaga.

"Ọ bụ na-enyaka ndị uweojii ka anyị ji hụ ozu ya".

Ọ sị na gọọmentị ya na agba mbọ ijide ndị mere ihe a ma hụkwa na etinyere ndị ọrụ nchekwa n'akụkụ dị n'iche iche ịhụ na-ọzọ emeghịzị.

Ka o si mee

Francis Ekechukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ nchekwa mkpọrọ n'Anambara kwuru etu ya bụ mkpa mkpa siri kpaa n'Ekwulobia ụnyaahụ nke butere ogbugbu otu onye ọrụ ha aha ya bụ Emmanuel Nwune nakwa onye uweojii.

Maazị Ekechukwu sị na ọ bụ ka ndị ọrụ ha si Nanka ala ka ha jekwuru ndị omekome a.

Ọ sị na ha gbara mbọ ka ha gaa zere isi ha n'ụlọ ọrụ ndị uweojii dị nso, mana ha ruru ebe ahụ were hụ na agbachiri ebe ahụ agbachi.

Maazị Ekechukwu sị na ha mechara chọpụta na ndị omekome wakporo ụlọ ọrụ ndị uweojii ahụ nke mere ha jiri gbara ya ọsọ.

Ọ sị n'ime ndị a nwụrụ bụ otu nwoke onye ọrụ ha na otu nwaanyị onye uweojii

Ihe onyonyo ndị hụrụ ihe a mere tinyere na soshal midia gosiri ozo ndị a n'ime ụgbọala.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a na-ame ka chị foro ụbọchi egbuchara onye uweojii nakwa ndi agha mmiri nọ ọrụ nchekwa na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Tochukwu Ikenganyia gwara BBC Igbo na ọ eziokwu na mkpa mkpa kpara ma sịkwa na ha na-agba mbọ ịmata etu o siri mee nakwa ndi aka ha dị na ya.

Ọ sị: "Ihe mere bụ ihe mgbawa obi. Ndị uweojii gbatara ebe ahụ ọsịsọ were chụpụ ndị omekome a."

Ọ sịkwa na ha na-eme nchọpụta banyere ha bụ mkpa mkpa.

Ọ bụ n'ụlo mkpọrọ nke dị n'Agụata ka ụgbọala awakporo si bilie njem.

BBC Igbo kpọrọ Francis Enobore bụ ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ mana ekwentị ya agaghị.

Nwakpo a mere dịka ọtụtụ mwakpo a na-awakpo ndị ọrụ nchekwa siri eme n'Ọwụwa Anyanwụ na nso nso.

Otu onye gọọmneị Anambara achọghị ka akọ aha ya sịrị na uche ha dị na ya ma kwukwa a o nwere ndị ha na-eche na ọ bụ ha na-akpa ike a.

Foto ndị mmadụ tinyere na soshal midia, nke BBC agaghị egosinwu, gosiri ozu mmadụ abụọ a egburu n'ime ụgbọala ha.