Senator Abaribe and Orji Uzor Kalu: Gịnị ka ha ji agba onwe ha egbe ọnụ?

Ebe foto si, Abaribe na Kalu/Facebook
Mmadụ abụọ nwere agba n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'Abia Steetị bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-adụ onwe ha aka n'ọnụ.
Esemokwu ha selitere isi elu ka a na-achọ ime ntuliaka onye ga-anọchiteanya mpaghara Aba North/South n'ụlọomeiwu nta dịka Ossy Prestige jibu ọkwa ahụ anwụọla.
Mmadụ abụọ gbapụtara ihe n'ịzọ ọkwa ahụ bụ Mascot Uzor nke APC na Chimaobi Ebisike nke PDP na ntuliaka a ga-adị n'ụbọchị Satọde 27 Maachị.
Kamgbe achụnta vootu malitere, sịnetọ Abaribe na Kalu na-akwarịta onwe ha egbe ọnụ dịka ha na-achọ ka onye ha na-akwado merie na ntuliaka.
N'akwụkwọ Abaribe bipụtara o kpọrọ "Made in Aba", o kwuru na ihe mere e ji chutuo ya n'ọkwa osote Kalu mgbe ọ bụ gọvanọ Abia Steetị n'afọ 2003 bụ maka na ọ jụrụ ịgbara mma Kalu egusi.
Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook
Ọ gara n'ihu kwuo na Kalu agbakebeghi site na mkpọrọ ọ gara n'ihi mpụ, tupu ọ bịa ị chụrụ nwanne ya Mascot Uzor Kalu nta vootu, na ọ maghị na ihe agbanweela n'Abia.
Na nzaghachị, Kalu boro Abaribe ọtụtụ ebubo gụnyere na o nweghi ihe ọ rụrụ kamgbe afọ iri na isii ọ nọrọla n'ụlọomeiwu.
Ọ gara n'ihu kwuo na Abaribe na-eri ego mgbazinye gọọmentị etiti ji enyere ndị mmadụ aka.
Na gọọmentị nyere ego site n'aka ndị Sịnetị atọ na-achịteanya Abia Steetị n'ụlọomeiwu ukwu mana na o nweghi onye ọbụla sinetọ Abaribe nyere ego n'Abia South.
BBC Igbo kpọtụrụ ndị Sịnetọ abụọ mana o nweghi onye n'ime ha kwuru okwu banyere ya.
Orji Uzor Kalu zara ekwentị ya ma sị na o nweghi ohere ebe Abaribe azaghị ekwentị ya.
BBC Igbo ga na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị sịnetọ abụọ, etu eke si anya anwụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: