Water Pollution: A chọpụtala ebe ihe gbarụrụ mmiri Nvuna Nomeh si pụta

Water Pollution: A chọpụtala ebe ihe gbarụrụ mmiri Nvuna Nomeh si pụta

Gọmenti Enugwu Steeti emechiela ngalaba ụlọọrụ D-Hap Integrated services limited dị n'Ituku bụ eche na ihe gbarụrụ mmiri Nvuna Nomeh si pụta.

Kọmishịọna na-ahụ maka gburugburu obibi bụ Chijioke Edoga gwara BBC na ndị ọrụ ya nụrụ mkpu akwa ndị obodo were gaa chọpụta na ihe gbarụrụ mmiri ahụ si n'ụlọọrụ na-emepụta 'ethanol'.

Edeoga sị na gọọmenti Enugwu agbachiela ngalaba ụlọọrụ ahụ na-emepụta ethanol ruo mgbe a ga-emecha nchọpụta.

O kwukwara na ha ewerela akụrụngwa si n'ụlọọrụ ahụ gawa mahadu UNN ime nyocha iji mata kpọmkwem ihe gbụrụ mmiri a.

Igwe ndị Nomeh bụ Igwe Israel Mba gwara BBC na kamgbe mmiri a gbarụrụ n'ụbọchị 16 Maachị na ndị Nomeh enweghị mmiri ọṅụṅụ maọbụ nke e ji eme ihe ọzọ.

Igwe Mba rịọrọ gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

BBC Igbo chọpụtara na mmiri ahụ a chapụla karịa ka ọ dị n'izuụka gara aga mgbe ihe a gbụrụ ya.

Kirie ihe ndị anyị chọpụtara n'uju;