Ihe anyị na-eme maka mkpa mkpa ndị otu nzuzo n'Ọkija - Uweojii Anambra

Ndị otu nzuzo

Ebe foto si, Police

Dịka mkpa mkpa dị otu nzuzo na abwanye na steeti ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bu Tochukwu Ikenganyia ekwuola etu na etu jiri chọọ isi buso ndị otu nzuzo na-akpa mkp amkpa na steeti gụnyere ime ka ndị ntoroọbịa hụta n'uru adịghị n'ajọ ihe dịka ihe a Bekee kpọrọ "cultism".

Ikenganyia sị na ha na ndị Okija enwela nkwekọrịta ịbịa malite ntụgharị uche ndị ntoroọbịa site n'atụmatụ ha hibere maka ya.

Atụmatụ a bụ nke Bekee kpọrọ "Police Campaign Against Cultism and Other Vices" bụ nke ndị uweojii na-ele anya na o nwereike nyere ha aka gbanye obi ndị ntoroọbị.

Cheta na ndị uweojii Anambra steeti na ndị agha Naịjrịa tikọrọ aka wakpo mpio ndị otu nzuzo dị na Okija dị n'Okpuruọchịchị Ihiala, Anambar steeti n'abalị Tuzde.

Ha jidere ndị otu a mmadụ asatọ ma natakwa ha ihe akaebe dị ka egbe anọ, mgbo, nma abụọ. okpu ndị agha, anwụrụike na ihe ndị ọzọ.

Ebe foto si, Police

Ha nwuchikwara mmadụ atọ ha che so gbupu otu nwaokorobịa isi na Okija n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Maach.

Cheta na ndị otu a gburu mmadụ abụọ n'obodo ahụ ụbọchị ahụ.

Ndị a ejidere bụ Ekene Ezeokalo, (19) onye ụkpọ Ukpor Nnewi, Emeka Iwuozor (30), onye Umuduru Ezia Ihiala na Chigozie Ohanaziem (27) onye Ogboro Umunwaji Ihiala.

Dịka ndị uweojii kwuru, mmadụ atọ a ekwetala na ha mere ya bụ arụ.

Ọgbaghara na-ada aghara aghara n'Anambara ugbua.

Ndị eche na ha bụ ndị otu nzuzo waporo ma napụ ndị nche egbe ha n'Obosi

Ebe foto si, Nweke Nweke

Chetakwa na ọgbaaghara dara na Obosi mgbe ndị nche so n'otu Anambra steeti Vigilantee group gara ịnata ụtụ nche n'Obosi ụbọchị bụ Mọnde ubọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maach.

Onye huru ebe ya bụ ihe mere na-achọghị ka aha ya pụta sị na "otu onye na-ere ihe n'akụkụ ụzọ ebe ahụ jụrụ ịkwụ ụgwọ nche".

Nke a mere ndị nche jiri buru oche o ji ere ihe ka ha gaa dowe n'ụlọọrụ ha.

"Ya bụ nwaamadị malitere zọsawa ha egbe ha bido tikuwe ndị otu ha", dịka o kwuru.

Okwu a malitere iri elu nke mere na ka chi ụnyaahụ foro, ndị otu a gara kụkachaa ụlọ ndị nche buru egbe ha laa.

Ndị nche sị na ọ bụ egbe isee ka ndị ahuuru mana ndị otu ahụ mechere buru egbe abụọ ga dowe n'ụlọọrụ ndị uweojii nọ n'Obosi.

Onye uweojii anyị kpọrọ sị na akụkọ a mere n'ezie mana na-ọbụghị ọrụ ya ịgwa ọhaneze ihe mere.

Kama ọ sị na ha ka na-enyocha ya bụ ihe.

Akụkọ ndị ọzọ anyị nụrụ na-ekwu na e jidere mmadị ise ndị otu a mana ndị uweojii ekweghị ekwu maka nke a ugbua.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ekwubeghị ihe ọbụla maka nke a.

Ọnweghị onye e gburu na ya bụ ihe.

Aha onyonyo,

Nnolim Nnaji: 'Ịchị ehi na-agharaị n'ụzọ anaghịzị ewu'

Akụkọ ga-amasị gị