Ariara shooting: Ọ bụ ndị bịara iwakpo ogige nchekwa anyị n'Aba ka anyị busoro agha n'abalị Tuzde - Ndị agha Naịjirịa

"Abia Ariaria soldiers shooting:"

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị agha

Ndị agha Naịjirịas n'otu Indigenous Peoples of Biafa (Ipob) agbajụọla akụkọ pụtara na ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa gburu ndị a sị bụ ndị otu Eastern Security Network (ESN) n'Aba, Abia steeti.

Akụkọ ahụ kwuburu na onye uweojii aha ya apụtaghị sị na ya bụ ihe mere na agbataụzọ Arịara dị n'Aba bụ ebe ya bụ akụkọ sị na ndị a egburu bịara ịwakpo ndị agha tupu e gbuo ha.

Ndị agha n'onwe ha kwneyere na ndị ji ọgatumtum wakporo ogige nchekwa ha ma kwasị ha mgbọ.

Ihe onyonyo na foto ndị rutere BBC Igbo aka gosiri na ọtụtụ ndị ikoroọbịa wasara n'ala anaghị emegharị ahụ.

Otu onye a na-anụ olu ya n'onyonyo ahụ kwuru na ndị ahu egburu ji mma na egbe bịa mwakpo tupu egbuo ha

Ndị ahụ na-ekwu okwu bụ ndị a na-eche na ha bụ ndị ọrụ nchekwa kwuru na ndị ahụ wụsara n'ala ji cha akwụkwọ ndụ.

Iho onyonyo ahụ egozighi ngwa agha mana otu foto BBC hụrụ gosiri otu egbe nakwa mma.

Ndị ahụ na-ekwu okwu n'onyonyo ahụ siri na ha ga-eji ụgbọala bburu ndị ahu wụsa n'ala pụọ.

Onyonyo ahụ egosighị ebe ihe a nọ mee.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia bụ Geoffrey Ogbonna ịmata nke bụ eziokwu mana ọ zaghị ekwentị ya.

Cheta na ndị oji egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ma gbuo ndị uweojii nọ ọrụ n'Agu Eze Amaogudu dị n'Abiriba nke okpuru ọchịchị Ohafia.

Ndi uweojii ha gburu gunyere Inspector Austin Ugwu, Inspector Longinus Ugochukwu na PC Ama Ifeanyi.

Geoffrey Ogbonna, kwuburu na ndi oji egbe buru egbe ndị uweojii ahị ha gburu gbalaga ma gbaa ụgbọala ha ọkụ.

"Onweghi ndị otu anyị egburu" - Ipob

Ebe foto si, Other

Nkọwa foto,

Ndị Eastern Security Network

Otu Ipob kwusiri ike, site n'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful binyere aka, na onweghi onye otu ESN egburu n'Aba.

Ha sị n'akụkọ na ihe dị otu a mere bụ okpotokpo asị.

Ipob si ihe na-eme bụ na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-anwụchi ndị ntoroọbịa na-agara onwe ha, egbu ha, ma kwuo na ha bụ ndị ESN.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị agha

Anyị emeghi njem gaa ogige ESN n'Abia na Wenezde - Ndị agha

Ndị agha Naịjirịa n'onwe ha sị na onweghi njem ndị otu ha gara na mpaghara ọbụla n'Abia steeti kama ọ bụ ndị ha amabeghi ndị ha bụ bịara wakpoo ogige nchekwa ndị agha n'Osisioma.

Captain Iliya Dauda sị na onweghi onye agha nwụrụ na mwakpo ahụ mana kwuo na ha chụpụrụ ndị a bịara mwakpo ahụ.

Cheta na izu agara aga, na ndị amaghị ndị ha bụ egbuola ndị agha nakwa ndị uweojii n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nara ha egbe ha.

A na-awakpokwa ma na-agba ụlọ ọrụ ndị uweojii ọrụ aghara aghara.