Unknown Gunmen in South-East: A wakpoghi ụlọakụ ọbụla n'Ogbunike - Ndị uweojii Anambara steeti

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na enweghi mwakpo ọbụla e mere n'ụlọakụ dị n'Ogbunike, n'okpuruọchịchị Oyi, n'ụbọchị Tọzde, Epreelụ 15, 2021.

Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na e nwere ọgbaghara n'ahịa Oye Olisa dị nso ụlọakụ, mana ndị oji egbe ahụ abanyeghi na ya bụ ụlọakụ.

Ikenga Tochukwu Anipr bụ onye na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru na mgbọ egbe ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ nọ na-agbali elu aghara aghara, tụrụ ụmụakwụkwọ abụọ nọ n'ime keke napep na-agafe.

Ka o si kwuo, e bugara ụmụakwụkwọ ahụ ụlọọgwụ, ebe dọkịta nọ kwuo na ha anwụọla.

Monday Bala Kuryas bụ kọmishọna uweojii na steeti ahụ tiri ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ aka n'obi, ma kwuo na ha na-ama imi n'ala ịchọta ndị omekome a bụ ndị gbakwara ụgbọala abụọ ọkụ ebe ha na-agba ọsọ.

Lee ụfọdụ 'unknown gunmen' na-egbu ndị nchekwa - Ndị Uweojii

Ebe foto si, Nigerian Police

Ndị uweojii anwụchiela mmadụ iri na isii ha sị bụ ndị oji egbe na-egbusi ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa karịsịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba wepụtara site n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

Ha sị na a nwụchiri ndị a site n'ọtụtụ nnyocha na isi imi n'ala nke si n'enyemaka ndịagha Naịjirịa nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.

Ndị ha nwụchiri gụnyere Ugochukwu Samuel (Biggy) dị afọ 38 bụ onye Arochukwu, Abia Steetị; Raphael Idang dị afọ 31 bụ onye Odukpani, Cross River.

Ebe foto si, Nigerian Police

Cletus Nwachukwu Egole dị afọ 60, bụ onye Orlu, Imo Steeti; Michael Uba dị afọ 33 bụ onye Imo Steetị na mmadụ 12 ndị ọzọ.

Ha sị na nnyocha gosiri na aka Ugochukwu Samuel na Raphael Idang dị n'ogbugbu ndị uweojii abụọ n'ụzọr Orlu-Ihiala n'ụbọchị 24 Disemba, 2020 ma gbaa ụgbọala ndị uweojii ọkụ.

Ebe foto si, Nigerian Police

Ndị uweojii sị na Cletus Nwachukwu Egole bụ ụkọchukwu n'ụlọụka Holy Blessed Trinity Sabbath dị n'Orlu ebe Michael Uba bụ onye amụma ndị okpukpere Jew; na ha nyere ndị oji egbe a nchekwa n'ụlọụka ha.

Ha kwukwara na ndị oji egbe a nọ n'ụlọ Cletus Nwachukwu Egole kpaa nkata ọtụtụ nwakpo ha mere; nakwa Egole ji ala nwanne ya mere ebe ọzụzụ ndị oji egbe a.

Ebe foto si, Nigerian Police

Ndị uweojii sị na ihe a natara ndị a gụnyere; egbe AK47 dị 10, egbe ndị ọzọ dị 5, mkpo mgbọ egbe dị 17, mgbọ egbe dị 549, ogbunigwe 10, uweojii ndịagha, ekwentị nzirita ozi na ihe ndị ọzọ.

Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Muhammed Adamu ekwusiela ika na ha agaghị anabata mwakpo ndị ọrụ nchekwa n'ụzọ ọbụla.

Ebe foto si, Nigerian Police

O kwuru na oge na-adịghị anya na aka ga-akparacha mmadụ niile na-awakpo ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa.

Adamu dụkwara ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha jikọlata ụmụ ha n'isonye n'ụzọ ime ihe ọjọọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Ndị ọjọọ egbuola nwa m bara Uweojii ka onyere mụ aka - Nne Miracle Nwobodo