Nnamdi Kanu: Ọ bụ ndị Fulani ka ESN na-ebuso agha na Na Nsukka

Nnamdi Kanu na otu 'Easter Security Network'

Ebe foto si, Getty/Ipob

Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob), ekwuola na ọ bụ ndị ọchịehi na-awakpo ala Igbo ka ndịọrụ nchekwa "Eastern Security Network" (ESN) na-awakpo na mpaghara Nsukka.

Kanu kwuru nke a dịka ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ na-ekwu na ndị ESN na-ebuso ndị agha Naịjirịa agha na Nsukka.

Na mgbasa ozi o mere n'akara soshal midia ya dị iche iche n'ụtụtụ Fraịde ka Mazi Nnamdi Kanu nọrọ kwuo okwu a.

Ọ kọwara sị: "Ọ bụ ndị wakporo ndị mmadụ n'Ebonyi steeti ka ESN busoro agha, chụrụ ha ọsọ gaa Nsukka."

"Mana ndị agha Naịjirịa nọ na Nsukka ekweghị ka ndị ESN chụọ ndị ọchị ehi ahụ."

"Ndị ekperima ka anyị na-achụ, ọ bụghị ndị agha Naịjirịa. Onweghị ihe anyị na ndị agha ji."

Aha onyonyo,

Eastern Security Network: 'Ọ bụ ndị Gọvanọ ọwụwa anwanwụ ka ụta dịịrị maka ESN'

Na mgbasa ozi ahụ kwa ka Nnamdi kanu nọrọ kpọpụta aha ndị ga na-achịkọta otu IPOB na mba United Kingdom.

Aha ha bụ Mercy Slatter na di ya bụ Mike Slatter.

Cheta na onye bụbu onyeisi IPOB na UK bụ Mazu Uche Mefor, onye bụkwa osote onyeisi IPOB n'ụwa niile.

Mana Uche Mefor na Nnamdi Kanu agbasaala, nke mere ka Mefor kwara pụọ na IPOB ma sonyere otu a kpọrọ 'Biafra de facto Customary Government'

Aha onyonyo,

Asari ejighi aka ya mee onwe ya onye isi oche Defacto Biafra Government - Uche Mefor

Nnamdị Kanu sị na ya hibere atụmatu ESN maka ịkwụsị mwakpo o sị na a na-awakpo ndị mmadụ n'ime ọhịa n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na otu Ipob bụ "otu na-eyi ọha egwu" mana Ipob na-ekwu na nke ahụ abụghị eziokwu.