Owerri Prison Break: Ọ bụghị ndị Ipob mere ihe mere n'Owerri - Hope Uzodimma

Hope Uzodimma

Ebe foto si, Facebook/Hope Uzodimma

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma agbaarala ndị otu nnwereonwe Biafra bụ "Indigenous People of Biafra' a ma dịka Ipob n'ịchafụ, akaebe na aka ha adịghị na mwakpo ụlọmkpọrọ nakwa ogige ndị uweojii ndị ekperima na-awakpo aghara aghara na steeti ahụ.

Na mkparịtaụka ya na Ụlọntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Wenezde, Uzodinma kwuru na ọ bụ dị ndọrọndọrọ ọchịchị obi adịghị mma na-etinye aka enwe n'ofe, a na-ebo ya ndị otu Ipob.

"Ọ bụghị Ipob. Eee, anyị kwere na anyị nwere ndị Ipob obi adịghị mma. Mana m ga-agwa gị, ọtụtụ n'ime ndị na-emebi ihe ndị a niile bụ ndị e si ebe ọzọ kpọbata n'Imo steeti."

"Ha (ndị ndọrọndọrọ ọchịchị) chọpụtara ihe bụ iwe ndị mmadụ n'otu ebe, ha gobiri ndị agboro si ebe ọzọ. Ha kpọbata ha ka na-eme ka ha abụ ndị Ipob, ha mee mpụ, ha agbalaga."

Uzodimma kwuru na ebumnobi ha bụ itinye ọchịchị ya na nke Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọgbaghara.

Ndị bu egbe wakporo isiụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọmkpọrọ Owere mepere ndị nga karịrị otu puku ka ha gbawara ụbọchị Mọnde mana iri asatọ n'ime ha lọghachiri ụbọchị Wenezde dịka gọọmenti etiti kwere nkwa ịgbaghara ha ma ha lọghachi.

Ihe ọma a ga-emere ndị si ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri gbapụ ọsọ ma ha lọghachite

Ebe foto si, Rauf Aregbesola Twitter

Nkọwa foto,

Rauf Aregbesola bụ mịnista na-ahụ maka ime obodo gara njem nleta n'ụlọmkpọrọ ahụ awakporo n'Owerri

Minista na-ahụ maka ime obodo bụ Rauf Aregbesola arịọla ndị ahụ si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owere gbaa ọsọ n'oge ndị oji egbe wakporo ebe ahụ ka ha biko lọghachite.

O kwuru nke a mgbe ọ gara njem ileta n'Owere ma sị na a ga-agbaghara ndị ga-alọghachị, ahụhụ e kwesịrị ịta ha maka isi n'ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ.

Lee ka o si aga n'Owere ebe osote onyeisiala wuchịrị n'okporoụzọ Dick Tiger dị n'Owere:

Nkọwa foto,

Yemi Osinbajo, Osote onyeisiala Naịjirịa na Gọvanọ Hope Ụzọdịmma n'Imo steeti taata

Kpochapụ ndị Ipob na ESN - Mohammed Adam bụbu Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa

Nkọwa foto,

Owerri Prison Break: Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa si ka ekpochapụ ndị Ipob na ESN

"Kpochapunu ndị Ipob na ESN kpamkpam" bụ okwu onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ IGP Mohammed Adamu mgbe ọ gara Owerri ileta ka mkpamkpa kpara ebe ahụ.

Nke a na-abịa dịka awakpochara ụlọ mkpọrọ na isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị n'isi obodo Imo steeti.

Mazi Raph Uwazuruike kwuru na onyeisi gburugburu ndi uweoji na nke commisioner imo state kwesichara igba arrụkwaghim maka mwakpo ụlọ mkpọrọ mere n'Owerri.

Uwazuruike kwuru na ọ katọghi nwakpo ahụ mere na Owerri n'ihi na onweghi onye ọbụla e gburu.

Ihe o kwuru n'uju dị ebe a:

Ọ katọrọ ọchịchị Muhammadu Buhari tụmadi etu ha si eme ihe gbasara ngalaba nchekwa.

Lee ka Owerri dị n'ụtụtụ ụbọchị abụọ dịka awakpochara ụọ mkpọrọ ebe ahụ

Ndị mmadụ ebidola pụtawa na bee ha ị ga ebe dị iche iche n'Owerri dịka a awakpochara ụlọ mkpọrọ dị n'isi obodo Imo steeti.

Ndị agha emepela ụfọdụ ebe ha mechichara n'obodo ahụ nke mere ka ndị mmadụ nweike na-akpagharị.

Mana otu onye gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ụlọakụ ekweghị emepere ndị mmadụ ụlọọrụ makana enyebeghị ha iwu ka ha mee nke a.

Ụfọdụ ndị kwuru na ụjọ ji ha maka nsogbu nchekwa dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

bụ mmadụ 1,844 si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owerri, Imo steeti gbafuo ka a wakporo ya n'abalị Sọnde.

Francis Enobore bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ ụlọmkpọrọ na Naịjiria, na-akọwa na ọ bụ mmadụ 1,844 si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owerri, Imo steeti gbafuo ka a wakporo ya n'abalị Sọnde.

Enobore kwuru na ndị omekome a na-amabeghi ndị ha bụ ji ogbunigwe gbarie ma bata ya bụ ụlọmkpọrọ.

N'ozi ahụ, o kwukwara na mmadụ 35 ekweghi eso ibe ha gbafuo.

Ozi ahụ kwukwara na John Mrabure bụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ ụlọmkpọrọ enyela iwu ka a maa imi n'ala ma nyochaa etu mkpamkpa a si mee.

Uweojii sị na ọ bụ Ipob mere mwakpo a mana Ipob sị na ọbụghị ha

Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu ekwuola na nyocha ha mere gosiri na ọ bụ ndị otu na-achọ nwereonwe mba Biafra na Naịjirịa Bekee kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) wakporo ụlọmkpọrọ na isi ụlọọrụ ndi uweojii n'Owere, Isi obodo Imo steeti.

Mana, akụkọ ụfọdụ ụlọntaakụkọ na-ede na-ekwu na Ipob agọọla na aka ha adịghị na mkpa mkpa.

Onyeisi ndị uweojii gara n'ihu kwuo na ha ezipula ndị otu iji gbaa ndị nke nọ n'Imo aka n'ukwu.

Ndị uweojii ga-esi ngalaba ndị nke Bekee kpọrọ "Police Mobile Force" (PMF) na ndị "Police Tactical Squads" nọ n'ụzọ ị ga Imo ugbua maka atụmatụ a.

N'akwụkwọ ozi Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba binyere aka kwuru sị na ndi bịara wakpoo ulọ ọrụ ndị a awakaporo n'Owere ji egbe di iche iche na ogbunigwe were bịa.

Ha sị na ndị a abaghị ebe egbe na-mgbọ ndị uweojii na-adị ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii chụlala ha.

Ha sikwa na ndị ahụ hapụrụ otu ụgbọala ha dịka ha na-ala.

Onyeisi ndị uweojii gakwara n'ihu kpọkuo ndi na-achi steeti dị iche iche ka ha kwuo okwu megede ihe a na-eme. Ha sịkwa ka ndị mmadu gbara uweojhii ama maka ihe na-eme n'obodo.

N'okwu ọgụgọ Ipob, ụlọ ntaakụkọ Nation dere na ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful sị "ka ndi ntaakụkọ na ndị gọọmentị Naijirịa kwụsị ibo Ipob ebubo banyere mwakpo a."

Ụlo ntaakụkọ ahu dere sị: "Ipob sị; "Ọ sị na ha "amaghi ndị unknow gunmen bụ", ma sịkwa na ha abụghị Ipob nke ha ji abụ ESN."

Ndị agha na-akwụsị ma na-enyocha ndị njem si Onicha aga Owerri kamgbe awakpochara ụlọ mkpọrọ dị ebe ahụ

Ebe foto si, BBC

Ka nke a na-eme, ndị agha Naịjirịa na-akwụsị ma na-enyocha ndị na-eme njem site n'Onicha gawa Owerri kamgbe ndị omekome wakpochara ụlọ mkpọrọ dị n'imo steeti ma gbuo otu onye.

Onye na-eme njem n'ụzọ si Ọnicha gawa Owerri gwara BBC nke a.

Nwa amadi a setere foto ebe ndị agha ahụ na-agwa ndị mmadụ ka chilie aka ha elu dịka ha na-eme njem.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe na-eme n'Owerri:

Ugo Ebujo bụ ọkaiwu nakwa dọkịta ahụike ekwuola na mwakpọ ndị o ji egbe ezu wakporo ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri bụkwa nnukwu nsogbu nyere ndị Igbo.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC Igbo nwere taa bụ ụbọchị April 5,2021.

Ugo kwuru ka ndị aka ha dị na ya bụ mwakpo gbara ọgwụ ha nwụọ makana okwu a aghọwala ihe ọzọ.

O kwuru na kama ndị Igbo ga na-egbu onwe ha na ọ dị mma ka e nwe atụmaatụ akpọrọ 'Restructuring'.

Na soshal midia, ndị mmadụ tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara ya. Lee ihe ụfọdụ kwuru:

Henry Shield kwuru na site na mwakpo ụlọmkpọrọ nakwa ụlọọrụ ndị uweojii mere n'Owerri, na ndị mmadụ ekwesịghị ịghọrị onwe ha na ha amaghị na agwọ nọ n'akịrịka na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ.

@SledgeAma kwuru na ebe o si dị njọ bụ na ọ bụ ndị na-amaghị ihe ọbụla gbasara ihe na-aga ga-akwụ ụgwọ ihe na-agbasaghị ha.

Otu onye nwụrụ mgbe ndị o ji egbe wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri

Otu onye nwụrụ mgbe ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owere, isi obodo Imo steeti n'abalị fotere ụtụtụ Mọnde ụbọchị Aprelụ 5,2021.

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ozu onye ahụ nwụrụ anwụ mana o dochaghị anya onye ọ bụ.

A na-eche na ọ bụ otu onye mkpọrọ a gbaturu dịka ha ji ọsọ na-agbapụ n'ụlọ mkpọrọ ahụ.

Ndị ekperima ahụ wakpokwara ụlọ mkpọrọ dị nso n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma tọhapụ ọtụtụ ndị mkpọrọ nọ n'ime ya.

O dochabeghị anya ihe merenụ kpọmkwem mana BBC ka na-agba mbọ ịchọpụta.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu azaghị ekwentị ya ugboro ugboro anyị kpọrọ ya.

Nkọwa foto,

Ụgbọala a gbara ọkụ n'okirikiri ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri

Ọnụ na-ekwukwara ndị ọrụ nchekwa ụlọ mkpọrọ n'Imo steeti bụ James Madugba kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi iji kọwaara ọhaneze ihe merenụ kpọmkwem.

Mana ndị bi n'Owere, ọ kachasị ndị bi nso n'ebe ya bụ ihe mere gwara BBC na ụra agaghị ha n'anya n'abalị ụnyaahụ niile.

Otu onye aha ya bụ Paul kwuru na ụda egbe ekweghị ha rahụ ụra n'abalị.

Mgbe BBC garuru n'ogige ebe mkpamkpa a kpara, ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ ekweghị ka anyị see onyonyo ọbụla.

Ha kwuru na ha ga-enweta ikike n'aka onyeisi ha tupu onye ọbụla esee foto.

Naanị n'ote aka ka ndị ntaakụkọ nwere ike ịnọ sete onyonyo ọbụla.

Nkọwa foto,

Ụgbọala a gbara ọkụ n'okirikiri ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri

Ndị uweojii machikwara ụgbọala ịgafe n'okirikiri ahụ.

BBC hụkwara opekatampe ụgbọala isii n'okirikiri ụlọ mkpọrọ ahụ

Onye ntaakụkọ ọzọ gwakwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ ji ogbunigwe gbawa ya bụ ụlọ mkpọrọ ahụ.

O kwuru na ha tọhapụrụ ihe ruru ndị mkpọrọ puku abụọ.

Ụlọọrụ Channels kwuru na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu kwetere na ya bụ mwakpo mere mana ọ kọwabeghị n'uju etu ya bụ ihe si mee.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: