Imo State News: Ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazigharịghị nchekwa ọwụwa anyanwụ, ESN ga-eguzosi ike

Law Mefor bụ ọkammụta

Ọkammụta Law Mefor akatọla mwakpọ ndị omekome wakporo ụlọ ọrụ ndị uweojii n'Ehime Mbano .

O kwuru na ya bụ ihe gbagọjuru anya ma na-eme ihere.

O kwuru na ndị uweojii ekwesighị ịgbapụta ozigbo bowe ndị otu Ipob ebubo maka ya bụ mkpa mkpa kama ha kwesiri iwepụta ihe gbara ọkpụrụkpụ gosiri ndị mere kpara ya bụ ajọ agwa.

O kwuru na ọ dịmma ka ndị gọvanọ na ndị ọnụ na-ekwu nọrọ n'ọgbakọ , kpaa maka inweta ezigbo ndị nchekwa obodo ga-echekwa mpaghara ọwụwa anyanwụ.

O kwuru na ihe mere Nnamdi Kanu ji hibe Eastern Security Network bụ makana ohere enweghị nchekwa dapụtara na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Mefor kwuru na ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazịghị nchekwa obodo ọfụma, ESN ga-eguzosi ike.

Etu e si gba ụlọọrụ ndị Uweojii ọkụ n'Ehime Mbano

Nkọwa foto,

Ụlọ ndị uweojii nakwa ọtụtụ ụgbọala dị n'ogige ahụ ka ndị ekperima gbara ọkụ.

Ihe ruru ụgbọala iri na abụọ na otu ọgbatumtum ka ndị ekperima lara n'iyi oge ha wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ehime Mbano n'ụbọchị Tuzde.

Ndị mere mwakpo a gbarikwara ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma tọhapụ ndị niile e ji eji, dịka ndị obodo si kwuo.

Mwakpo a mere ka ọ gachara awa olemole Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo gara Owerri, isi obodo Imo steeti, iji anya ya hụrụ ihe e mebiri oge ndị ekperima wakporo isi ụlkọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ mkpọrọ dị n'Owere n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde.

Chetakwa na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu gakwara Owere n'ụbọchị Tuzde ka o were anya gbaara onwe ya ekeresimesi, mana ọ ka nọ n'Owere oge ozi pụtara na Onyeisiala Muhammadu Buhari agbaneela ya tinye onye ọhụrụ.

Oge ya bụ mwakpo mere n'Ehime Mbano na mgbede ụbọchị Tuzde, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, kwuru na ọ bụ ụgbọala atọ ka a gbara ọkụ.

Mana mgbe BBC gbara ụkwụ ebe ahụ n'ụtụ Wenezde a, anyị hụrụ na ụgbọala gbara ọkụ mere nkarị.

Dịka Orlando Ikeokwu si kwuo, onweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na mwakpo ahụ.

Nkọwa foto,

Ụgbọala a gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii n'Ehime Mbano

Ndị uweojii ekweghị ka ndị ntaakụkọ anyị see onyonyo ọbụla, mana ha gbara mbọ isete foto ndị a dị n'akụkọ a.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ekperima ahụ tọhapụrụ ndị e ji eji tupu ha zunye ogige ha ọkụ.

Nkọwa foto,

Ụlọ ndị uweojii nakwa ọtụtụ ụgbọala dị n'ogige ahụ ka ndị ekperima gbara ọkụ.