How to make black soap: Lee etu e si emepụta ncha nkọta e ji agwọ ọkọ dị iche iche
How to make black soap: Lee etu e si emepụta ncha nkọta e ji agwọ ọkọ dị iche iche
Nwada Florence Okorie na-emepụta ncha nkọta kọwaara BBC Igbo etu o si emepụta nche a nke o ji azụ ezinaụlọ ya.
Ọ sị na ọ na-eji nkwu mkpụrụ nkwụ emepụta ncha nkọta a dịka ha mụtara ya n'aka ndị nna nna ha.
Okorie gosiri ka o ji ngwu mkpọrọ akwụọ okụ ka o ree ma bụrụ ntụ.
Dịka o rechara na ọ ga-etinye ya mmiri ma zaa ya.
Mmiri ahụ azapụtara na ya ka a ga-esi n'ọkụ ruo mgbe ọ ga-atafọ obere mmiri, e tinye zie ya mmanụ ma hapụ ya n'ọkụ ruo mgbe ọ tacha mmiri.
Okorie sị na a na-eji ncha ndị a asa ahụ, akwa, efere na ihe ndị ọzọ.
Ọ na-enye aka ịgwọ ọkọ, kịtịkpa, ọkpụisi eri ego, akpụkpa na ihe ndị ọzọ na-eme n'ahụ mmadụ.
Kirie ihe o kwuru n'uju;