Mbieri Police Attack: Ndị wakporo obodo anyị bụ ndị be anyị si n'ụlọmkpọrọ Owere gbaa ọsọ - PG Mbieri

Ụlọ ọrụ ndị uweojii na Mbieri

Onyeisioche ọgbakọ obodo Mbieri bụ Adolphus Nnadi, ekwuola na ọ bụ ụmụokorobịa obodo ha si n'ụlọmkpọrọ dị n'Owere gbaa ọsọ, wakporo ụlọ ndị uweojii dị n'obodo ha n'ụbọchị Wenezde.

Ụmụ okorobịa karịrị iri abụọ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị na Mbieri, gbaa ha egbe ma mebisia ụfọdụ ihe.

Adolphus Nnadi kọwara na ndị mere ihe ahụ bụ ụmụ obodo ha na-enyebu ha nsogbu ma na-ere ọgwụike dị icheiche, mana ndị obodo gbakọrọ aka buso ha agha, nwuchie ha, ma nyefeee ha n'aka ndị uweojii nke mere e ji tinye ha na nga.

Mana oge ha si n'ụlọ nga gbapụta, ha lọghachiri Mbieri wee ṅụọ iyi na ha ga-abọ ọbọ ihe ndị obodo mere ha.

Nnadi gara n'ihu kwuo na obi dị ya ụtọ etu ndị uweojii si kwụdosie ike ma chụọ ndị ntorobịa ahụ ọsọ.

Nkọwa foto,

Adolphus Nnadi sị na ọ bụ ya ji ọkwa praịm mịnịsta n'obodo Mbieri

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ eze ọdịnala Mbieri bụ Eze Madumere, ọ katọrọ ya bụ ihe merenụ ma kwuo na Mbieri bụ obodo e ji udo mara.

N'aka nke ha, ndị uweojii n'Imo steetị kwuru na mmadụ abụo ndị otu ha merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo.

Ụlọ ntaakụkọ Channels TV kwukwar na otu onye uweojii na-efu efu site na mwakpo a, mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC na nke ahụ abụghị eziokwu.

Ebe foto si, Orlando Ikeokwu

Nkọwa foto,

Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti

Ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi

N'akụkọ yiri ibe ya, ndị o ji egbe gara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo Ugbodo di n'Okpuru Ọchịchị Ebonyi nke dị n'Ebonyi Steeti.

Ndi uweojii kwuru na otu onye ojiegbe nwụrụ na mwakpo ahụ ebe otu onye uweojii merụrụ ahụ.

Mwakpo ndị a na-abịa dịka oke mwakpo na-eme n'ebe dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anywụ Naịjirịa.

Mwakpo a mere n'Abalị Tusde.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah mana ọ zaghị ekwentị ya.

Onye ntaakụkọ ya na BBC na-arụ ọrụ na steeti ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ihe a mere ma kwukwa na a gwara ha na ọ bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii gburugburu bụ Frank Mba ga-etinye ọnụ n'ihe a mere dịrị.

BBC Igbo kpọtụụrụ Frank Mba, o wee kwuo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.