Imo state news: Ndị ntọ tọọrọ Eze, ndị nze ya na mmadụ anọ ndị ọzọ, atọhapụla ha

Eze Charles Iroegbu bụ ya nwe ụlọọrụ ụgbọala 'All States Mass Transit'

Ebe foto si, Chibuzor Ekenze

Nkọwa foto,

Ọ bụ Eze Charles Iroegbu nwe ụlọọrụ ụgbọala 'All States Mass Transit'

A tọhapụla Eze Charles Ndubuisi Iroegbu (Ezie 1 of Umuezie) nke Umuezie Nguru Autonomous Community na ndị imeobi.

Ọgọ ya nwoke bụ Chibuzo Ekenze bụ onye gwara BBC nke a na nso nso a.

Mana Ekenze ekwughị ma o nwere ụgwọ a kwụrụ tupu a gbapụta ha.

Obodo na-edebu jiji n'Umuezi Nguru, dị n'Aboh Mbaise, Imo steeti, dika ndị ntọ tọọrọ Eze obodo ahụ bụ Eze Charles Ndụbuisi Iroegbu na mmadụ isii ndị ọzọ gụnyere ndị obi ya n'abalị n'abalị Tuzde(6/4/2021).

Ndị ntọ atọọrọla Eze, ndị nze ya na mmadụ anọ ndị ọzọ

A tọọrọ ndị a dịka ha si Mbanọ ebe ha gara agbamnkwụ na-alọta.

Ọgọ Eze Iroegbu bụ Maazị Chibuzo Ekenze gwara BBC Igbo na ọ bụ mmadụ asaa ka ndị omekome ahụ tọrọ gụnyere "Eze Iroegbu, ọkparanne ya, nwanne papa, ndị nze abụọ, na ndị ntoroọbịa na-eso eze abụọ."

Ekenze gbara ama na ọ bụ "Ha nọ n'ime ụgbọala abụọ (hummer bus nakwa obere ụgbọala ọzọ) si agbamakwụkwọ omenala enyi Eze na-ala, ka ndị bu egbe nọchiri ha, "ma yigharị ebe ha na-aga ka ọdachi ahụ mere.

"Ha kwapụrụ ọkwọụgbọala bu eze, ọkwọụgbọala ha nọchie, ha jirizie ụgbọala nke ha nwere duru ha gbawara."

Ekenze kwuru na kemgbe ya bụ ihe mere, o nwebeghị onye kpọrọ ezinaụlọ ha nye ha ozi ọbụla maka ndị atọọrọ.

O kwuru na mbọ niile ha gbara inweta ndị ahụ atọọrọ n'ekwentị amịtaghị mkpụrụ dịka akara ekwentị ha anaghị aga aga.

Ikenze kwuru na ha ewegharala ndị uweojii nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu mkpesa maka ihe mere.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị Umuezi Nguru Aboh Mbaise chị obi ha n'aka.

"Onye ọbụla nọpụrụ ka ebe ndị mmadụ nwuru."

Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, ekwenti ya agaghị aga.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: