Owerri Prison Break: Ihe a na-eme n’ala Igbo bụ ajọ ekwe na-akụ - Uche Mefor

Uche Mefor, Alloy Ejimakor na onye ọrụ BBC Igbo

Onye bubu Osote onyeisi otu Ipob bụ Uche Mefor ekwuola na ihe na-eme n'Imo steeti na-egosi na nchekwa na-adakpọ adakpọ n'Ọwụwa Anyanwụ nke e kwesịrị ịjụ ndịgọvanọ mpagara ahụ ajụjụ maka ya.

Mefor kwuru na mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii na-arị ibe ya elu n'ala Igbo tụmadị ụlọ mkpọrọ agbakara n'Imo steeti jogburu onwe ya.

"Ihe ndị a na-eme n'ala Igbo bụ ajọ ekwe na-akụ."

Na mkparịtaụka BBC hibere ụbọchị Tọzde gbasara mwakpo aghara aghara n'ụlọọrụ ndị uweojii na ogige ha na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, Uche Mefor na Aloy Ejimakor tinyere ọnụ n'okwu ahụ.

Ejimakor bụ onye ọkaiwu Nnamdi Kanu bu ụzọ kọwaa na o nweghi mgbe ndị Ipob ji eme ụdịrị ihe ahụ.

O kwuru na otu ahụ apụtala mgbe mbụ ihe a mere ma kwuo okwu maka ya.

N'ọnụ ya "anyị (Ipob) agaghịzi etinye ọnụ n'okwu ahụ ọzọ ma ncha".

N'aka ọzọ, Uche Mefor bụ onye mgbasaozi otu Biafra Defacto Government tinyere ọnụ n'okwu ahụ sị na ihe a na-eme n'ala Igbo bụ ajọ ekwe na-akụ.

O kwuru bụ na ọ bụrụ na obodo adịghị mma, na ọ bụ ndị na-achị obodo kwesiri ịza ajụjụ maka ya.

Lee ihe ndị dị mkpa pụtara na mkparịtaụka ahụ n'uju ebe a:

Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Ejimakor na Mefor kwuru:

- Mefor kpọrọ ndị Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ oku ka nwee otu nchekwa ga-ekpuchi mpaghara ahụ.

- Mefor kwukwara na onyeisi ndị uweojii nke achụrụ n'ọrụ emeghi nnyocha tupu ọ kpọọ otu Ipob aha na ọ bụ ha wakporo ụlọọrụ ndị uwoejii.

- Ejimakor kwuru na o nweghi ihe mere ndị mmadụ ji kwusie ike na ọ bụ Ipob na ESN mere ihe ahụ ebe Gọvanọ Hope Uzodimma kwuru na ọ bụghị Ipob mere ya.

- Mefor kwuru na o nweghi isi etu otu Gọvanọ ga-apụta kwuo na ọ ma ndị meere ihe a ebe Gọvanọ ọzọ na-ekwu na amaghị ndị mere ya.

- Mefor kwukwara na ndị ọchịchị niile n'ala Igbo gụnyere ndị omeiwu steeti, ndị omeiwu etiti nakwa ndị gọvanọ kwesiri ịnọkọ ọnụ tụọ alo maka nchekwa ala Igbo n'ihi na ọ bụ ihe dị ndị Igbo mkpa.