Imo Prison Break: Ọ bụ otu Gọvanọ chịburu Imo steeti haziri ndị wakporo ụlọmkpọrọ n'Owerri - Declan Emelumba

Declan Emelumba

Ebe foto si, Declan Emelumba

Nkọwa foto,

Declan Emelumba bụ Kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti

Dịka a ka na-achọ ndị ekperima wakporo ụlọ mkpọrọ nakwa isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Owere n'ụbọchị ise nke ọnwa Eprel 2020, Kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti bụ Declan Emelumba ekwuola na ọ bụ otu onye bụbu gọvanọ Imo Steeti haziri ndị ekperima mere ya bụ mwakpo.

Emelumba kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Owere n'ụbọchị Tọzde.

Ọ bụ eziokwu na Emelumba akpọghị onye ọbụla aha, mana ụfọdụ ihe o kwuru rụtụrụ aka onye ọ na-ekwu maka ya.

Lee ụfọdụ Ihe Emelumba kwuru nke nwere ike igosi onye ọ na-ebo ebubo a:

Nkọwa foto,

Onye ka gọọmentị Imo steeti na-ebo ebubo maka mwakpo a na-eme n'Owerri?

  • Onye ahụ bụ onye chịburu Imo steeti dịka Gọvanọ
  • Onye ahụ bụ onye gọọmentị Imo steeti jichiri akụnaụba ya nke ha boro ebubo na o nwetara n'ụzọ ezighi ezi
  • Onye ahụ gara ụlọikpe ịkwụsị gọọmentị Imo steeti ijichi akụnụba ya
  • Onye ahụ ji aka ike chọọ iweghara akụnụba ya nke gọọmentị Imo steeti jichiri
  • Onye ahụ ekwubeghị okwu ọbụla iji katọọ mwakpo ndị ekperima na-eme n'Imo steeti na nsonso a
  • Otu ndị ntoroọbịa mpaghara Ugwu wepụtara akwụkwọ ozi ebe ha nọrọ katọọ gọvanọ Imo steeti nke nọ ugbua, ma too gọvanọ nke ahụ pụrụ apụ

Ọ bụrụ na i lechaa nkọwa ndị a anya, ị ga-eji uche mara onye Emelumba na-ekwu maka ya, maka na a tụọ ilu nkịrịka nkata, onye agwara amarala onwe ya.

Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Emelumba, o kwuru na ya kwuru ihe ndị ahụ n'eziokwu.

O kwukwara na ya ga-akpọghachi anyị azụ ka o tiwaara anyị akụ oyibo nsugbe.

Emelumba na Uzodinma na-ekwu otu ihe

Ebe foto si, Hope Uzodinma

Nkọwa foto,

Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma

Cheta na Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwukwara ihe yitere nke a Emelumba kwuru.

Uzodinma gwara ndị ntaakụkọ Channels na ọ bụghị ndị otu IPOB na-eme mwakpo ahụ dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ si ekwu.

"Anyị ma ndị na-akwado ndị ekperima ka ha na-awakpo Imo steeti," Uzodinma na-ekwu.

"Anyị ma ebe ha nọ mee ya bụ nzukọ nakwa etu ha si mee ya."

"Ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a na-esi n'ebe dị icheiche akpọbata ndị ekperima ka ha na-awakpo steeti anyị."

Mana Uzodinma akpọghị onye ọbụla aha, kama o kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu, "obere oge, ihe niile ga-apụta ihe".