Sunday Igboho: Ụlọọrụ DSS kpụpụtara ndị enyemaka 8 nke ya n'ụlọikpe taa

Ndị ọrụ Sunday Igboho

Ndị enyemaka nke Sunday Igboho a nwụchịrị n'ụbọchị Jụlaị 1, 2021 ka ụlọọrụ Department of State Services kpụpụtara n'ụlọikpe ụkwụ dị n'Abuja taa bụ August 2,2021.

Ndị DSS nwụchịrị ndị ọrụ enyemaka Igboho mgbe ha wakporo ụlọ ya n'ụbọchị Jụlaị 1, 2021, mana ndị ọrụ enyemaka ahụ akpụkpụla DSS ụlọikpe makana ha kwuru na ha megidere ikike diri onye.

Pelumi Olajenbesi bụ ọkaiwu ndị ọrụ enyemaka Igboho kpụkpụrụ DSS n'ụlọikpe ma na-ekwu na ndị nke ya n'okpuru kamgbe izu ụka ole na ole gara aga.

Ọkaikpe Obiora Egwuatu kpebiri ikpe ahụ nyere iwu ka DSS kpọpụta ndị ọrụ enyemaka Igboho ruru iri abụọ n'ụbọchị Jụlaị 29,2021.

Mana ụbọchị ikpe, DSS dara iwu ahụ dịka ha akpọpụtaghị ndị ọrụ enyemaka ha.

Ọkaikpe Egwuatu nyere iwu ọzọ ma bụgharịa ikpe ahụ ruo taa bụ August 2,2021.

Ala Igbo abụghị ebe a na-alụ agha, Sunday Igboho gaa kpalite okwu n'ala Yoruba - Dkt Egbujo

Ebe foto si, Ugo Egbujo FB/ Sunday Igboho IG

Dkt Ugo Egbujo bụ onye ọnụ na-eru n'okwu etinyela ọnụ n'ihe Sunday Igboho bụ onye bu ihe gbasara nnwereonwe ala Yoruba n'isi, kwuru gbasara ịdọnyere ndị Igbo ukwu.

Igboho kwuru na ha bụ ndị Yoruba ga-adọnyere ndị Ọwụwa Anyanwụ ukwu ma ndịagha na-awakpo ha, mana Egbujo kwuru na nke a dịkwa ka ikpalite okwu ọzọ.

Egbujo kwuru na kama Igboho na-adọnyere ndị Ọwụwa Anyanwụ ukwu, na ya gawa ala Yoruba gaa kpalite okwu nke ga-eme ka ndị agha wakpowe ha, n'ihi na ọ bụ naanị udo ka a chọrọ n'ala Igbo karịa nkwado ga-eme ka ọgbaghara bawanye.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na Igboho nwere ihe ọma ndị o merela, mana ọ ga-adị mma ka ọ gbado anya n'ihe gbasara ndị Oduduwa (ndị Ndịda Anyanwụ) ma hapụ ihe gbasara Ọwụwa Anyanwụ.

"Sunday Igboho chọọ ka ọ baa ndị agha ọgụ, ya kpọta ha n'Ibadan ka ha lụtụwa ọgụ. Ya chọrọ ndị Unknown Gunmen nke ya ka ya na ndị agha lụtụwa ọgụ, ọ bụghị Ala Igbo ka a ge-eji eme ebe a na-alụ agha na ebe a na-aba ndị agha ọgụ."

"Ihe anyị chọrọ n'Ala Igbo bụ udo na ọganihu, ka onye ọbụla nwee ike ịpụ gaa kpata ihe ha na ụmụ ga-eri.

Anyị achọghị ka anyị na ndị agha nakwa ndị uweojii nwee nsogbu, anyị achọghị ndị ga-enyere anyị aka ịtụgharị Ala Igbo ka ọ bụrụ ebe a na-agba mgba, ma Sunday Igboho ma ndị otu ya.

Ihe ala Igbo chọrọ bụ ịrata akụnaụba si mba ọzọ nke Bekee kpọrọ 'foreign investment".

Egbujo kwukwara na ọ ga-adị mma ka mmadụ niile nọ n'Ala Igbo, ma ndị ụkọchukwu ma ndị nze na ọzọ nakwa Ọhanaeze jikọọ aka ọnụ ma kwuo na ha achọghị ndị oji egbe egbu mmadụ, ma sị ha laghachịkwa ebe ha si.

Ọ rụtụkwara aka n'etu ndị ndịda niile si gbaghapụ ndị Igbo mgbe agha Biafra bidoro, n'agbanyeghi etu ha niile si mee ka ha akwadoro ndị Igbo mgbe ahụ.

Ọ sị na nkwado Sunday Igboho a dị ka atụmatụ ịrapụtakwa ndị Igbo ọzọ.

'Gọọmentị iwakpo Ọwụwa Anyanwụ dịka ịwakpo ndị Yoruba, anyị ga-adọnyere ndị Igbo ukwu' - Sunday Igboho

Sunday 'Igboho' Adeyemo bụ onye bu ihe gbasara dọrọ gọọmentị etiti Naịjiria aka na ntị ka ha zere ihe ọbụla gbasara iwakpo mpaghara Ọwụwa Anyanwụ "n'ihi na iwakpo ha dị ka iwakpo ndị Yoruba".

Igboho kwuru na ndịagha Naịjiria na-awakpo ndị na-achọ nnwereonwe Biafra na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ma kwuo na ha bụ ndị Yoruba ga-adọnyere ha ukwu ma ndịagha wakpoo ha ọzọ.

Igboho si n'ọnụ Olayomi Koenke bụ onye nnọchiteanya ya kwupute nke a n'ihe nkiri o mere n'elu soshal midia, n'ụbọchị Mọnde, Mee 17, 2021.