Imo State News: Ọ bụ ndị otu nzuzo gbara egbe n'abalị Tuzde - Ndị uweojii

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Bala Elkana gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị otu nzuzo abụọ nọ na-agbarịta egbe a nụrụ ụda ya n'Owere, Imo steeti n'abalị Tuzde, Mee 18, 2021.

Elkana kwuru na enweghi onye nwụrụ ka a na-agba egbe ahụ, ma kwuo na ha ezigala ndị uweojii n'ebe ihe mere iji kwụsị mkpamkpa ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ụjọ atụla ndị mmadụ.

Maka onye uweojii e gburu na mpaghara 'IMSU Junction', Bala kwuru na ọ natachabeghi ozi banyere ya.

Etu ndị ojiegbe si gbuo otu onye uweojii n'Owerri

Akụkọ apụtala nke ọma gbasara otu nwaokorobịa a hụrụ ozu ya na mpaghara mahadu Imo steeti a na-akpọ 'IMSU Junction'.

Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ọ bụ onye uweojii nke na-arụ ọrụ na ngalaba 'operations' n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Owerri.

Aha ya bụ Loveday Obinonu, ọ bụ onye Uratta n'okpuru ọchịchị Owere Nọt.

Onye ezinụlọ ya kwuru na a gbara ya egbe ihe dịka ugboro anọ maọbụ ise n'isi ya tupu ọ nwụọ.

Ndị uweojii ebugala ozu ya n'ụlọ ozu dị n'Aladimma, Owere.

Amabeghị kpọmkwem onye maọbụ ndị gburu nwa amadị a, mana ozu ya tọgbọrọ n'ime ọwa mmiri n'ụtụtụ taa, dịka ndị mmadụ gbara ebe ahụ okirikiri.

Ụdaegbe anaghị ekwe ndị mmadụ rahụ ụra n'Owere ugbua

Abalị fotere ụtụtụ Wenezde a dịka ebe a na-alụ agha na mpaghara dị icheiche n'ime Owere, isi obodo Imo steeti, dịka BBC Igbo si nweta akụkọ.

Ndị mmadụ kwuru na mpaghara Wetheral, Douglas, nakwa Mbaise road, ka ụda egbe na-ada n'elu n'ala.

Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụra agaghị ha n'anya n'ihi etu ya bụ ụda egbe si ada.

"Ọ na-ada ka ebe a na-alụ agha ogologo abalị niile," onye ntaakụkọ anyị kwuru

"N'abalị gara aga, ọ bụ na mpaghara Orji ka ya bụ ụdaegbe na-ada."

Cheta na ndị ojiegbe awakpola ọtụtụ ebe n'Owere n'ọdị nso a.

Ebe ndị ha wakporola gụnyere:

  • Ụlọ mkpọrọ dị n'Owere
  • Isi ụlọọrụ ndị uweojii
  • Ụlọ Gọvanọ Hope Uzodinma dị n'Omuma

Anyị kpọrọ Bala Elkana, onye malitere ọrụ ọhụrụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti, mana ọ zaghị ekwentị ya.