Ezeribe Chigbu killing: Ezinụlọ Ezeribe Chigbu akpọpụla ndị agha Naịjirịa ụlọikpe maka ebubo igbu nwa ha

Ezeribe Chigbu killing: Ezinụlọ Ezeribe Chigbu akpọpụla ndị agha Naịjirịa ụlọikpe maka ebubo igbu nwa ha

Ezinụlọ Noel Ezeribe Chigbu akpụpụla ndị agha Naịjirịa ụlọikpe maka ebubo na ọ bụ ha gburu nwa ha nwoke.

Cheta na BBC Igbo wepụtaburu akụkọ maka nwa amadị a egburu n'ime ụgbọala ya n'Owere, isi obodo Imo Steeti, n'ọnwa Eprel afọ a.

Oge ya bụ ikpe malitere n'ụlọikpe dị n'Owere, onyeisi ndị agha Naịjirịa abịaghị.

Onye ọrụ ụlọikpe ahụ kọwara oge ọ gara Abuja inye onyeisi ndị agha akwụkwọ ikpe, o kweghị anara ya.

Nke a mere ka ọkaikpe Maureen Onyetenu nye iwu ka e tinye akwụkwọ ikpe ahụ n'akwụkwọ akụkọ Punch, ka onyeisi ndị agha gụọ ya ebe ahụ.

O yigharịkwara ikpe ahụ ka ọ dịzie n'abalị abụọ nke ọnwa Sepụtemba, ka ndị agha Naịjirịa bịa zara ọnụ ha maka ebubo e boro ha.

'Otu ụbọchị ahụ dị m zụtara m ụgbọala ka ndị nchekwa gburu ya n'ime ụgbọala ahụ n'Owere'

Cheta na oge akụkọ a pụtara ọhụrụ, BBC gara gbaa nwunye Noel Chigbu bụ Chdimma ajụjụ ọnụ o wee kọọrọ anyị etu di ya si nwụọ n'aka ndị ọrụ nchekwa.

O kwuru na di ya zụtaara ya ụgbọala ọhụrụ n'ụbọchị ahụ e gburu ya.

Chidimma sị na di ya bụ onye na-azụ achịcha bekee a na-etinye anụ n'ime ya nke ndị Bekee na-akpọ 'shawarma'.

Kirie onyonyoo ya n'elu.