Israel-Palestinian conflict: Ọ bụ amara Chukwu mere na ogbunigwe egbughi m n'ụlọ m - Ogbonna Ibezito

Ogbonna Ibezito

Ebe foto si, Other

Nkọwa foto,

Ogbonna Ibezito gbaburu Naijirịa bọọlụ agbanahụna ọnwụ dịka ogbunigwe dara n'ụlo ya.

Ibezito Ogbonna dị afọ iri atọ na asatọ ma bụrụ kwa bụ onye gbara agba U-23 nke ndị otu bọọlụ Naijirịa agbanahụna ọnwụ dịka ọgbunigwe si Gaza danyere n'ụlọ ya dị na Ashod na mba Izrel n'izuụka gara aga.

Ogbonna onye soro ndị otu Hapoel Tel Aviv were buru iko mba Israel n'afọ 2006 na 2007 na nwinye ya na ụmu ya no n'ụlọ ha mgbe ya bụ ogbunigwe dara n'ụbọchị.

Enweghị mere ezinụlo ya kama Ogbonna merụru ahụ ma a kpọrọ ya gaa ụlo ọgwụ.

Ogbonna gwara BBC Sports sị " Nke a na-eme ya ugboro atọ ihuọma m na-azọpụta m dịka ogbunigwe a egbughị m, enwela m ihe mberede okporo ụzọ ma nwee kwa mgbe ndị ohi wakporo na Naijirịa".

"Anyị ma na enwereike ịtụ ogbunigwe kama opi na-egbukarị iji gwa ndị mmadụ na ogbunigwe nwereike ịda. Ndị mmadụ na-agbaba n'ụlọ nchekwa mgbe ọbụla anyị nụrụ opi a".

" A na m eri nrị ụtụtụ mgbe opi a daara kama echere m na ọ ga-adị ka ụbọchi ndị ọzọ anyị ga-agbaba n'ụlo nchekwa, amaghị na ọ ogbunigwe ahụ ga-ada n'ụlọ m".

"A nụrụ m ihe dara ụda ma tulie m elu site n'ebe m na-eri nrị tụga m n'ọnụ ụlo m na-ehi ụra".

Ebe foto si, Other

Nkọwa foto,

Ụlọ Ibezito Ogbonna dịka Ogbunigwe dachara na ya

"Nwunye m na ụmụ m nwekwara ihuọma, ha emerụghị ahụ"

Ogbonna kwuru sị, " Emerụrụ m ahụ ma ikpere m na-afụ kwa m ụfụ nke ukwu. A nọ m n'ụlọọgwụ awa ole na ole ebe ha mere nyocha dị iche iche iji mata etu ime ahụ m dị".

Ihe Iribeama

Ebe foto si, Other

Dịka onye gbarala bọolụ na mba Romania, Saụt Afrịka, Albania. Kazakhstanm na North Macedonia, ụdịrị ihe mberede a emetubeghị ya mbụ.

Ọ gara n'ihu kwuo, "Na m sị na ihe a mere m pụta bụ ihe iribeama dị ukwu n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-emerụ ahụ ebe ọ dị njọ"

"Echefughị m, ndị madụ na-agbatara m ọsọ enyemaka"

Ebe foto si, Other

Nkọwa foto,

Ihe onyonyo gosiri ka ndị ọrụ ahụike gbata gbata na-enyere Ogbonna aka

Ugbu a ha na-enweghịzị ụlọ, Ogbonna na ezinụlo iri na atọ ọzọ nọ n'ụlo ndịna dịka gọọmentị Mba Israel na-achọrọ ha ebe obibi ọzọ.

N'otu aka ahụ Ogbonna onye gbaburu ndị Kaizr Chief nke ndị Saut Afrịka ka bụ kwa ọdịnobi ndị nkwado otu Hapoel Tel Aviv nke mba Israel.

O kwuru sị, " Ndị nkwado Hapoel Tel Aviv gosiri na ha hụrụ ma n'anya, ha zitere m ozi ebe ụfọdụ ebidola ịtụkọtara m ego maka ihe ọdachi a".

'Izrel ka bụ obodo chekwara nke ọma'

Dịka mba Israel na Gaza kwụsịrị ọgụ ha lụrụ ụbọchị iri na otu, Ogbonna ka kwenyere na israel bụ obodo nwere ezi nchekwa ma sị kwa na ohere dịịrị ndị Naijirịa na-gba bọọlụ ịbịa na mba Israel bịa chọrọ akara aka ha.