Sunday Igboho: Etu ndị ndu Yoruba si azọ isi ya na Benin Republic

Ndị ndu ọdịnala Yoruba bi na Benin Republic

Ndị ndu ọdịnala Yoruba bi na Benin Republic nwere ọgbakọ n'obieze Ajohoun dị na Benin n'ụbọchị Sọnde.

Isisekpu ntị n'ọgbakọ ha bụ maka okwu Sunday Adeyemo e ji Sunday Igbogho maara bụ onye ga-alaghachị n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde.

Na ngwụcha nzukọ ha, otu n'ime ha gwara BBC Yoruba sị na ihe ha chọrọ bụ udo na ụzọ a ga-eji gboo nsogbu a.

Ha sị na nkwekọrịta ha bụ idegaara onyeisiala mba Benin akwụkwọ, degaara minista na-ahụ maka ikpe nakwa onyeisi ụlọomeiwu ha akwụkwọ.

Mana ha e kwughi kpọmkwem ihe ha ga-ede n'ime akwụkwọ ozi ahụ.

Oba Siyan Aladjohoun sị na ha ga-eme njem nleta n'obi ọchịchị gọọmentị ma ọ bụrụ na elebaghị anya n'ihe ha dere n'akwụkwọ ozi.

Ihe mere Sunday Igbogho ka ji nọrọ n'aka gọọmenti Benin ruo ugbua- Ọkaiwu

Ebe foto si, Koikimedia/ Bamidele Salami

Ibrahim Salami, bụ otu n'ime ndị ọkaiwu Sunday Igboho, akọwaala na ọ bụghị okwu passport adịgboroja mere e jiri nwuchie nwa amadị ahụ na mba Bene Rịpọblik.

Salami kọwara na ọ bụ gọọmentị Naịjirịa degaara gọọmentị Bene akwụkwọ ka a nwuchie Igboho, mana ha bụ ndị ọkaiwu ya agaghị ekwe ka a kpọlata ya Naịjirịa.

Salami bụ ọkaiwu bi na Cotonou gọnahụrụ akụkọ na-ekwu na gọọmenti mba ahụ tiri Igboho ezigbo ihe.

Ndị ọrụ nchekwa ọdọụgbọelu d na Cotonou nwụchịrị Igboho na nwunye ya bụ Ropo, mgbe ha na-eme njem aga Germany, ma mechaa tọhapụ nwụnye ya.

Igboho pụtara n'ihu ụlọikpe akpọrọ "Cour D'Appal De Cotonou" n'ụbọchị Fraide bụ agba nke mbụ n'ime agba atọ ọkaiwu Salami kwuru Igboho ga-agabiga n'ikpe ya.

Aha onyonyo,

Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche

O kwuru na gọọmenti Naịjirịa na-ebo Igboho ebubo ịtị mgbere ahịa ngwa agha nakwa ikpalite ọgbaghara na Naịjirịa nke Igboho gọnahụrụla.

N'ọnụ ya, " ndị mmadụ na-ebugharị ọtụtu akụkọ ụgha gbasara nwụchị Igboho."

"Anyị hụrụ Igboho n'ụlọọrụ ndị uweojii, e tighị ya ihe, e wakpọghị ya nke e ji eji ịga atụ ya n'ụkwụ."

"Ihe na-adịghị mma e mere Igboho na-esoghị iwu bụ na a tụrụ ya ịga nke mere na o nweghị ihe ọ ga-emeli n'aka ya, nke ahụ megidere iwu ikike diri onwe."

"Anyị na ndị uweojii na ndị ọkaiwu akpala maka nwụchị ya."

Kedụzị ihe bụ ihe ọjọ Igboho mere?

Ọkaiwu Salami kwuru na ihe gọọmenti Naịjirịa na-ebo Igboho bụ na nke mbụ, ha kwuru na ọ na-atụbata ngwa agha bata Naịjiịrịa.

"Ha kwuru na ọ na-achọ ikpalite ọgbaghara na Naịjirịa, nke atọ bụ na ọ na-achọ itisa mba Naịjiria.

"Mana anyị na-ekwu na ebubo ndị a abụghị eziokwu, o bughị ngwa agaha na-alụsọ ndị mmadụ agha, o nweghị ihe gosiri na ebube ndị a bụ eziokwu."

Ọ na-ahazị ngagharaiwe udo, ihe dị mkpa bụ na anyị agaghị ekwe ka akpọlata Igboho mba Naịjirịa."

Etu e si nwụchị Igboho na Benin

"Mgbe Sunday si Naịjirịa pụọ, o si azụ ụlọ banye Benin, ya na nwunye," dịka ọkaiwu Salami si gwa BBC Yoruba.

"Ha mechara si Benin gawa Germany bụ ebe nwunye ya na ụmụ ya asaa bi."

"Ọ bụ mgbe ha nọ n'ọdọụgbọelu ịgawa Germany ka aka kpara ya."

"Ọ bụ ndị ọrụ nchekwa nke ukwu nke ọdọụgbọelu Benin kwụsịrị ha ma si na ọ bụ gọọmenti Naịjirịa degara gọọmenti Benin akwụkwọ ma si ha nwụchịe Igboho na mba ha."

" O nweghị iwu Benin ọ mebiri, o nweghị akwụkwụ njem Benin a hụrụ n'aka Igboho mgbe a nwụchịrị ya."

Ọ bụ akwụkwọ njem Naịjirịa ka o ji , n'ime ya enwere mbinye akwụkwọ obibi ndị Germany. Ọ gaghị e ji visa banye Germany."

"Anyị achọghị ka gọọmenti Benin nwụye Igboho n'aka gọọmenti Naịjirịa makana anyị hụbeghị ihe gosiri na o mebiri iwu Naịjiria dịka gọọmenti mba ahụ si ebo ya."

A ga-esi na Benin kpọlatanwụ Igboho Naịjiria?

Ọkaiwu Salami kwuru na ọ bụru na mmadụ mebie iwu na mba ọzọ, e nwereike isi otu mba gaa mba ọzọ mọbụrụ na onwere nkwekọrịta jịkọtara mba abụọ ahụ.

O kwuru na onweghị nkwekọrịta nke a akpọrọ "extradition accord" dị n'etiti Benin na Naịjirịa.

"Mana ọ bụrụ na-esi n'ụzọ nkwekọrịta nhazị ndọrọndọrọ ọchịchị, o nweghị iwu ọbụla ga-akwụsị ya."

Sunday Igboho nwere ike ịga nga na Benin Republic maka 'passport' adigboroja - Eze Ajase

Ebe foto si, Sunday Igboho

Ọ bụ eziokwu na gọọmentị Bene Repọblik ajụla ịkpọghachi Sunday Igboho na Naịjirịa, mana nwa amadị ahụ ka nwere ike ịga mkpọrọ afọ iri abụọ na otu na mba Benin n'ihi na akwụkwọ njirimara nwamaala nke Bekee kpọrọ passport adigboroja.

Onye kwuru nke a bụ Ichie Toluwalase Oguntosin, Eze obodo Ajase dị na mba Bene Repọblik,obodo ha na Naijiria nwere oke ala.

Ichie Oguntosin kọwara na iwu mba ahụ gbasara inweta akwụkwọ ikike siri nnukwu ike, na ha ejighi ya egwu egwu ma ncha.

Oguntosin kwuru sị: "Iji maa atụ, nwunye m bụ onye Naịjirịa, anyị lụrụ ọtụtụ afọ gara aga, mana o nwetabeghị akwụkwọ njirimara nwamaala Bene ruo ugbua."

"Anyị mụrụ ụmụ ise, atọ n'ime ha bụ ndị a mụrụ na Bene, mana abụọ ndị ọzọ ahụ anyị mụrụ na Naịjirịa enweghị akwụkwọ njirimara nwamaala Bene."

"Iwu inweta akwụkwọ njirimara nwamaala Bene abụghị iwu e ji egwu egwu chaa chaa."

Oguntosin kwuru na ya ma na onye ọbụla dara iwu a ga-aga mkpọrọ afọ iri abụọ na otu, "mana amaghị m ka ya bụ iwu dị ugbua."

Etu onye mbịarambịara nwere ike iji nweta akwụkwọ njirimara nwamaala Bene

Ichie Toluwalase Oguntosin kọwara na tupu mmadụ enweta akwụkwọ njirimara nwamaala nke mba Bene:

  • Onye ahụ ga-ebu ụzọ nweta akara njirimara bụ 'National Identity Card'.
  • Onye enweghị akara njirimara a agaghị enwetanwu 'passport'.
  • Akara njirimara a ga-enwekwa aha ndị ezinaụlọ onye ahụ iji gosi kpọmkwem na ọ bụ onye Bene.
  • Ọ ga-adị mfe ndị ọrụ nchekwa ịchọpụta onye ji 'passport' adịgboroja n'ihi na onye ahụ agaghị enwe akara njirimara
  • Etu onye mbịarambịara nwere ike iji nweta akwụkwọ njirimara nwaamaala mba Bene bụ site n'ịlụ onye mba ahụ, ha agbaa akwụkwọ n'ụlọikpe.
  • Nke a ga-enyezi onye ahụ ohere itinye akwụkwọ ka e nye ya akara njirimara, nke ọ ga-ejizi tinye akwụkwọ maka akwụkwọ njirimara nwamaala.