Enyinnaya Abaribe: Aga m akwudoro Nnamdi Kanu ọzọ ma ọ bụrụ

Sịnatọ Eyinnaya Abaribe

Senetọ na-anọchite Abia South n'ụlọomeiwu Ukwu bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ya enweghị mgbe ya ji hụ Nnamdi Kanu dịka onye rapụtara ya oge ọ kwudooro ya n'ụlọikpe.

Abaribe kwuru na ọ bụrụ n'ọnọdụ ihe mere ka ya kwụdoro Nnamdi Kanu n'afọ 2017 mekwa ọzọ, na ya ga-akwụdokwara ya ọzọ dịka onye akaebe.

Abaribe kwuru nke n'oge ya na ụlọọrụ TVC nwere mkparịtaụka ụbọchị Wenezde.

N'ajụjụ onye ntaakụkọ jụrụ ya sị, "Oge Nnamdi Kanụ gbara ọsọ n'ụlọikpe, kedụ ihe ị na-eche n'obi gị?"

Abaribe sara ya sị, "Oge ọ gbara ọsọ ndụ, ọ bụghị ọsọ ka ọ gbara n'ikpe n'ihi na o nwere ihe dị iche na ị gba ọsọ ndụ na ịgba ọsọ n'ikpe."

"A gaghachiri m n'ụlọikpe gakwuru ọkaikpe sị ya na mgbe ikpeazụ a hụrụ Nnamdi Kanu, ọ bụ ya na ndị agha Naijiria ka a hụrụ ya na ha oge ha wakporo be nna ya, ya mere ọ bụ ha ka ọ dịrị ịkọwapụta ihe mere."

"Ọkaikpe were kpebie na iwu ahụ ejighịkwa anyị ma nye akwụkwọ iwu ka a nwụchie ya."

O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-eti mkpu sị Abaribe kpụta ya amaghị maka nke a.

"Echeghị m na ọ rapụtara m n'ihi na ọ bụ ọsọ ndụ ya ka ọ na-agba. Kedụ ka ọ gaara esi zitere m ozi?"

"Ọ tụrụ m n'anya dịka onye ọbụla oge a hụkwara ya ọzọ na Izrel."

"Edegaara m Mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ akwụkwọ gwa ha ka ha gwa ụlọnnọchiteanya anyị na mba Izrel ka ha chọpụta ma onye ahụ a hụrụ foto ya ọ bụ Nnamdi Kanu n'ezie, mana o nweghị ọsịsa m nwetara."

Asị gị kwudoro ya ọzọ, ị ga-akwụdo?

Ebe foto si, BBC/ElliotUkoh/@realFFK

Abaribe sara sị, "ọ bụrụ na ihe dị ka ọ dị na mbụ, gịnị mere na m agaghị eme ya ọzọ?

"Ọnọdụ ọkpaikpe nyere na mbụ bụ na a chọrọ onye Senetọr soro na ndị ga-akwụdoro ya. Ọ bụrụ na ọkpaikpe kwuo otu ahụ ọzọ, o nweghị ihe m hụrụ ga-eme na m agaghị eme ya ọzọ.

"Abụ m onye sinetọ. Esi m Ọwụwa-Anyanwụ."

"Oge ahụ abụ m onye isi 'South-East Caucus, ugbua, Ike Ekweremadu bụ onyeisi 'South East Caucus'. Ikekwe o nwere ike ikweta kwudoro ya."

Abaribe kwuru na ihe ọchịchị Muhammadu Buhari na-eme bụ ịgwọ njirimara ọrịa hapụ ihe butere ọrịa ahụ dịka ọ rụtụrụ aka na Sunday Igboho na mkpu nnwereonwe na-arị elu si,ọ bụ emeghị nwa ka e mere ibe ya butere nsogbu e nwere ugbua na Naijiria.

Cheta na a nwụchigharịị Nnamdi Kanu n'abalị 26 na Mba Kenya kpụlata ya Naijiria ebe a kpụuru ya ụlọikpe maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria, iyiegwu, ị nwe otu iwu machiri na iji ngwaọgụ..