Reno Omokri, gosi ihe akaebe na Igbo bụbu ohu ndị Bini- Ọkammụta Obasi Igwe

Aha onyonyo,

Ihe Ọkammụta Obasi Igwe kwuru maka okwu na ndị Igbo ịgbara ndị Bini ohu oge gboo

Ọkammụta Obasi Igwe bụ onye guru akwụkwọ banyere ihe mere mgbe gboo gwara anyị na ihe Reno Omokri kwuru enweghi ebe mbido aka.

Igwe kwuru na akwụkwọ gosiri na ndị Igbo na ndị Bini bikoro ọnụ mgbe gboo ma kekọrịtakwa omenala mana mmekọ ha agbughi nke ohu na nna ukwu, kama na mmekọ ha bụ dịka ndị agbata obi.

O kwukwara maka agha ndị igbo na ndị Bini lụrụ, nke ndị Igbo nyere ndị Bini aka lụọ na etu ndị Igbo siri kuzirere ma kwadọ ndị Bini na otutu ihe mmuta dịka:

  • Ndị agha Igbo kwadoro ndị agha Bini na ọgụ ị nwete mmeri mpaghara nakwa alaeze Oba Legọs
  • Ọgụgụ Ụbọchị Izu (Nkwọ, Eke, Orie, Afọ)
  • Otutu okwu asụsụ dịka (Ọkụkọ)
  • Etu e si achọpụta ndị mgba asi

Gee ya n'uju ebe a

Etu nkata a siri bido

Akụkọ na-efeghari na soshal mịdịa kemgbe ụbọchị Tọọzde nke Reno Omokri bụ onye bubu onye enyemaka aka chibụrụ Naijịria, Goodluck Jonathan zipụtere na-ekwu na ndị Igbo na mgbe gboo bụ ndị ohu nye ndị Bini.

N'ozi Omokri wepụ tara n'akara Facebook ya, ọ gwara mmadụ na aha nna nna ya bụ "Ikengbuwa nke Mbụ " nke bụ nwa eze.

Nke a mere ka onye ahụ saa ya sị na aha ahụ dara ka aha Igbo.

Ọsịsa ahụ mere ka Omokri wepụtara ya bụ ihe nkiri nke o kwuru n'ime ya na n'ezie, ndị Igbo gbara ndị Bini ohu mgbe gboo.

O gbadoro ụkwụ n'ihe o si na ọkammụta n'okwu banyere ihe mere mgbe gboo bụ nwa amadi onye Bekee ọ kpọrọ David Attenborough kwuru.

Aha onyonyo,

BBC Igbo Exclusive : Ndị Igbo kwesịrị ịchị Naịjirịa na 2023 mana ha na ndị ugwu ga-adị na mma - Shehu Sani

N'ozi a, David Attenborough zipụtere maka ihe mere n'oge afọ 1550, o gosiri akpụrụakpụ nke ọsịrị bụ ọba Bini na onye ohu bụ onye Igbo.

Ọkammụta Attenborough kwuru na ihe o jiri mara na ya bụ nwa ohu akpụrụ akpụbụ bụ onye bụ site na ichi njiri mara ndị Igbo mgbe gboo nke okwuru na ya bụ n'ezie akara agbụrụ ndị Igbo.

Dịka akụkọ a na-efeghari, anyị na ọkammụta Obasi Igwe, onye bu onye okankuzi na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' nwere mkpakọrịtaụka maka ya bụ okwu a kpụ n'ọnụ.

Aha onyonyo,

Ifeanyi Ubah : Gọọmenti etiti bia kọwara sineti etu ha si nwụchie Nnamdi Kanu