Isaac Chinagorom: Etu m siri turu ugo n'asọmpi egwu 'Malibu World Dancing Championship' na 1984

Isaac Chinagorom: Etu m siri turu ugo n'asọmpi egwu 'Malibu World Dancing Championship' na 1984

Isaac Chinagorom bụ ọgbaegwu riteere Naịjirịa nturu ugo n'asọmpi mbaụwa e mere na London n'afọ 1984.

Ihe a kpọrọ asọmpi a bụ 'Malibu World Dancing Championship'.

Dịka Mazi Isaac Chinagorom siri kọọrọ BBC Igbo, ọ bụ Muhammadu Buhari bụ ọchịagha na-achị Naịjirịa n'oge ọ gara asọmpi ahụ.

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto,

Isaac Chinnagorom ebe o ji nturuugo o riteere ala Naịjirịa n'afọ 1984

O kwuru na Buhari kwere ya nkwa na ọ gaa turu ugo lọta, na gọọmentị ga-enye ya ụlọ iji jaa ya mma.

Ọ gara ya bụ asọmpi ma gbaa onye nke atọ n'ime mmadụ iri isii (60).

Mana oteghị aka ọ lọtara, a chụpụ Buhari n'ọkwa ọchịagha.

Ugbua Buhari bụụr onyeisiala Naịjirịa ọzọ, Isaac Chinagorom na-arịọ ka o mezuo nkwa ahụ o kwere ya, afọ iri atọ na asaa gara aga.

Onye mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru.