Rudy Rochman: Ihe anya m hụrụ n'aka ndị DSS Naịjirịa

Rudy Rochman

Ebe foto si, Rudy Rochman

Nkọwa foto,

Rudy Rochman bịara ala Igbo ime nnyocha etu ndị Igbo na ndị Jew siri metụta

Rudy Rochman ekwuola na ọnweghị ihe ga-egbochi ya ịkọ akụkọ ndị Igbo bụ ndị Juu.

Rochman bụ nwa okorobịa mba Israel bịara Naịjirịa ime nnyocha gbasara ihe jikọrọ ndị Igbo na ndị Juu nke mba Izrel.

Mana ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS nwuchiri ya na ndị otu ya bụ Noam Leibman na David Benaym n'Anambra steeti oge ha na-ese ihe onyonyo ha ji eme nnyocha ha.

Ọ bụ mmadụ atọ a butere ihe onyinye a na-akpọ 'Sefer Torah' nke ha nyere ndị okpukperechi Jew nọ na Naịjirịa mgbe anwụchiri ha.

Etu e si nwuchie Rudy Rochman na ndị otu ya

Ebe foto si, Rudy Rochman/Facebook

Nkọwa foto,

Rudy Rochman gara n'obi Eze Chukwuemeka Eri, Eze obodo Aguleri n'Anambra steeti, dịka ọ na-eme nnyocha ya

Rochman na ndị otu ya abụọ batara Naịjirịa n'ụbọchị isii nke ọnwa Julaị afọ 2021.

N'abalị asaa nke ọnwa Julaị, ha gara njem nleta n'obi Eze obodo Aguleri bụ Chukwuemeka Eri iji kọwaara ya onwe ha nakwa ihe ha ji maka ya bịa.

Mana dịka Rochman siri kwuo, ndị DSS nwuchiri ya na ụmụnne ya n'ụbọchị itoolu nke Julaị ma tụkpuo ha na nga.

O kwuru sị: "Anyị wepụtara izuụka abụọ iji see onyonyo n'ala Igbo, mana naanị abalị abụọ ka anyị serela tupu anwụchie anyị."

"Ndị bu egbe, kpuchiri ihu ha bịara kwakpuo anyị n'ime ụgbọala, nara anyị ekwentị na akwụkwọ 'passport' anyị."

Ebe foto si, Rudy Rochman

Nkọwa foto,

Rudy Rochman na ndị ntorobịa ndị Igbo

"Anyị ahụghị eluigwe anya, anyị na onye ọbụla enweghị mkparịtaụka ruo abalị iri abụọ tupu ha atọhapụ anyị."

"Anyị bịara ka anyị kọọ akụkọ, mana anyị tụgharịrị ghọọ akụkọ a na-akọ akọ."

Rudy Rochman kwuru na ha alaghachila mba Israel ugbua mana obi ha kd dị n'ala Igbo.

O kwukwara na amachiela ha ịbata Naịjirịa ọzọ, "mana anyị ga-akọrịrị akụkọ gbasara umunne anyị ndị Igbo."

Ọ gara n'ihu kwuo sị "onweghị ihe ọbụla gbasara ihe anyị na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị, maọbụ ịkwado ndị chọrọ ikewapụ na Naịjirịa."

Aha onyonyo,

Sefer Torah ndị Izrel nyere anyị abụghị maka Biafra - Ndị Igbo Jew

Onye na-ahazị ndị Ntoroọbịa otu 'National Jewish Council' nke Naịjirịa bụ Solomon Yaakov Maduako, gwara BBC Igbo na onye otu ha aha ya bụ Lisbon Agha bka nọkwa n'aka ndị DSS.

Maduako kwuru sị, "Anyị na-atụ anya na ugbua atọhapụrụ ndị mba Israel atọ na anyị nwereike ịga leta Agha".

O kwukwara na Judaism na ọchụchọ Biafra abụghị otu ihe, o kwuru sị, "Anyị anọọrọla kamgbe tupu ọchụchọ Biafra ebido".

Ndị DSS ekwubeghị ihe ọbụla gbasara nnwuchi ndị a.