Ipob news today: Ihe Nnamdi Kanu chọrọ na-aka ndị na-eso ya - Ifeanyi Ejiofor

Nnamdi Kanu na Ifeanyi Ejiofor
Nkọwa foto,

Nnamdi Kanu na Ifeanyi Ejiofor

Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi ndị otu IPOB agwala ndị nkwado ya ka ha hapụ ọgbaaghara, kama ka ha were udo na-achịkọta onwe ha dịka ha na-enye ya nkwado.

Ọ bụ ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru nke a n'ụbọchị Tọzde, dịka ọ gara leta ya n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS, ebe e ji ya kamgbe ọnwa June afọ a.

Ejiofor kwuru na Kanu gosiri nnukwu ịtụnanya etu nde kwuru nde ndị mmadu si egosi ya ịhụnanya nakwa nkwado.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya kọwakwaara Kanu ihe mere na Goomenti Etiti abaghị Ụlọikpe Ukwu dị n'Ụmụahịa, bụ ebe Kanu gbara ha akwụkwọ maka ịwakpọ be nna ya na Septemba 14, afọ 2017.

Ihe Nnamdi Kanu gwara Ifeanyi Ejiofor ka ọ hụrụ ya n'ụbọchị 23 nke Ọgọst

Ebe foto si, Nnamdi Kanu na Ifeanyi Ejiofor Facebook page

Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor ekwuola ihe mere Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra enwebeghị ike zipute ozi n'igwe okwu maọbụ onyonyo nye ndị na-eso ya.

O kwuru na iwu na-achị mkpọrọ ebe e ji Nnamdi Kanu akwadoghị atụmaatụ ahụ.

Ejiofor gwara BBC Igbo na ọ na-agba mbọ ime ihe ga-aka atụmatụ ahụ mma.

O kwuru sị, "Anyị edenyela akwụkwọ gbasara arịrịọ a ndị mmadụ na-arịọ inụ olu maọbụ hụ ihu Nnamdi Kanu. Ihe ọbụla pụtara na ya anyị ga-eme ka ọhaneze mara."

Aha onyonyo,

Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor

Ọkaiwu Ejiofor depụtara n'akara Facebok ya, na ụbọchị August 23,2021 ha gara ihu Nnamdi Kanu, ahụ na okwukwe ya siri ya ike.

"Kanu na-ezitere ụnụ na-eso ya nnukwu ekele maka nkwado, ekpere, nakwa ihunanya ụnụ na-egosi ya tụmadị n'oge a"

O depụtara na ọ gaghị achọ ikwuputecha ihe niile Kanu gwara ya mgbe ọ gara ihu ya.

Aha onyonyo,

Nnamdi Kanu anọghị na nga na Singapore - Aloy Ejimakor

Lee ndụmọdụ ọhụrụ Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdị Kanu dụrụ ndị Ipob

Otu okaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor arịọla ndi otu ha ka ha biko dere juu ma gbara ịme ka ndị iro ha chịa ha ọchị ọsọ.

Ejiofor gbara sị na "onye amaghị na e tinyere ezigbo ego n'itinye ọgbaaghara n'ime ndị otu Ipob kwesiri ịmata ihe".

O kwuru ihe a n'ozi Facebook o ziputara ụbọchị Wenezde.

Ọ sị na 'akaọrụ ha dị mfe, ịmebi, ịbute ọgbaghara n'ime ha, ịme ya ka ọ dị ka ọ bụ unu na-eme ya.

"Biko ụmụchụkwụ, unu anabatazịna ha maọbụ ịja ha ike maka na ha nọ n'ezigbo ọrụ pụrụiche".

Ọ sị na ịmata ndị nduhie dị otu a esighị ike "maka na Agadị nwaanyị anaghị aka nka na-egwu ọ ma agba".

Ejiofor sị na ịhe kacha mkpa ugbua bụ udo na iruwe isi na ekpere ha makana n'oge adịghị anya Nnamdi Kanu ga-apụta n'ụlọ mkpọrọ DSS.

Ihe Okaiwu Nnamdị Kanu huru mgbe o zutere ya n'ụlọmkpọrọ ndị DSS

Otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdị Kanu bụ onyeisi ndị otu Indeginous People of Biafra (Ipob) ekwuola ihe ya na Nnamdị Kanu kpara mgbe ọ gara hụ ya n'ụlọmkpọrọ ndị DSS.

Ejiofor kwuru na ọ bụ maka egwu ha yiri ndị DSS site n'ịdegara ụlọikpe akwụkwọ maka otu ha siri jụ na ha agaghị ahụ Nnamdị Kanu oge mbụ mere ha jizi kpọwa ha mbaaka mbaaka ka ha bịa ụnyaahụ bịa hụ ya.

Ejiofor sị na "ndị DSS nabatara anyị nke ọma maka na akwụkwọ iwu sị ha nabata anyị".

Ọ sị na ha na Nnamdị Kanu kpara nkata nke ọma.

Ebe foto si, Nigeria Presidency-Facebook

O kwuru na ihe niile ha kpara abụghị ihe ọ ga-ekwuwa n'ọha, mana nke ka mkpa bụ na ha hụrụ ya.

Ejiofor sị na "onye ji mmadụ n'ala ji onwe ya",

Ọ kpọkụrụ Igbo nọ n'ụlọ na Igbo nọ n'ama ka ha banye ekpere maka na "ọ bụ Igbo niile ka a tụrụ ịga dowe otu ebe. Onye ọbụla mara ka ọ ga-esi tinye ọnụ n'okwu a, ya tinye. Maka na ihe mere Nnamdị Kanu mere Igbo niile."

Ọ sị na Nnamdị Kanu sị na ya amaghị na ya ga-adị ndụ ruo taa maka ahụhụ ndị kenya tara ya.

Aha onyonyo,

Ifeanyi Ejiofor

Ejiofor sị na ha na ndị Kenye nwere ezigbo nkata pụrụiche ha ga-akpa maka ihe ha mere Nnamdị Kanu.

Ọ sị na Nnamdị Kanu sị na ụdị ahụhụ na akaje ha mere ya na Kenya gosiri na ọ bụ ogbugbu ka ha chọrọ igbu ya.

Ọ sị na ọ bụ ama ka agbaara n'isi Kanu e jiri nwuchie ya, "Ọ bụ oke nọ n'ụlọ gwara oke nọ n'ama na ngwugwu ogiri dị n'anya ọkụ".

Ejiofor kwusiri ike na ọ bụ ndị Naịjirịa na ndị Kenya kpara ya bụ nkata Ijide Nnamdị Kanu.

Ọ kwuru na ya agaghị akpọ aha ndị niile aha ha dị na ya bụ nkata, maka na ọ bụghị nke ahụ bụ mkpa ya ugbua.

Ọ sị na ihe kacha mkpa ugbua bụ na atọhapụrụ Nnamdị Kanu, maka na ọ bụ ya bụ isiokwu maka akwụkwọ niile ana agba maka ya na mba dị iche iche.

Aha onyonyo,

Oraifite Killing: 'Anya hụrụ Ifeanyi Ejiofor na ndị otu ya gwa anyị'- Uweojii

O kwukwara na ha na-arịọ ụlọikpe ka ha nwee ohere ịkpọtara Nnamdị Kanu dibia bekee ga-eleta ya anya nke ọma maka na ụlọọgwụ ndị DSS ezughị oke.

Ọ sị na agbanyeghị ahụhụ niile atara ya na Kenya, n'obi siri ya ike.

Na ọ na-ekele ndị niile na enye aka na agbara ya mbo kemgbe ọ nọ na mkpọrọ.

Akụkọ ga-amasị gị