Ipob Sit At Home Order: 'Ụjọ ji anyị ịpụta'

Taa bụ ụbọchị Monde ọzọ n'ala Igbo ebe ndị mmadụ kpọchiri onwe ha n'ime ụlọ maka 'Sit at Home' nke otu Ipob hibere.
Na-agbanyeghi na ndị isi otu Ipobgwara ndị mmadụ ka ha gawara onwe ha, na ngwụcha izuụka gara aga, ụfọdụ akụkụ Ipob kwuru na mmachi ahụ adịghịzị ebe ndị ọzọ na-ekwusiike na ọ ga-adị.
Lee ka o si metụta ebe dị icheiche n'ala Igbo taata bụ Ọgọst 16, afọ 2021.
N'Enugwu Steeti
Otu onye bi n'Enugwu steeti kọọrọ BBC Igbo etu njem ya site Enugwu gawa Ọgwụ sịrị gaa banyere ọnọdụ Sit-at-home.
O kwuru na ọ gara n'ụlo akụ were mee ihe ọ chọrọ ime.
Ya bụ onye kwukwara na ọ gara ebe a na-ere mmanụ ụgbọala zụta mmanụ n'ụzọ gawara Ọgwụ.
O kwụrụ na ụlọ ahịa na ụlọọrụ gọọmentị nọ ebe ahụ mechiri emechi.
Ụmụ akwụkwọ n'Ebonyi Steeti
Kama o kwuru na mgbe ọ na-alọghachọị Enugwu ka ọ hụrụ ụgbọala bọs ndị NYSC awakporo ma mebie n'ụzọ si Ọgwụ aga Mgbowo ebe igige ndị NYSC nọ.
Ọ mere ka anyị ghọta na ndị uweojii ekweghị ya seta ihe foto.
Onye a kwuru na ọ hụkwara ụịgbọala na-ebu ndị mmadụ awakporo n'ụzọ Nnenwe.
Ọ kọwara na enyi ya gwara ya na ndị omekome anọ jị ọgbatumtum bịara ahịa oye Nnenwe ma jiri egbe na mma chụsasịa ndị ahịa.
Onye a kwukwara na mgbe ọ na-ala na ebe na-ere mmanụ ụgbọala emechiela n'oge erụghịeru.
N'Ebonyi steeti
Ihe onye ntaakụkọ BBC nọ n'Ebonyi ji anya ya hụ bụ na ọ bụ mmechi obere dị ebe ahụ.
Ọ kọwara na ọ bụ ụfọdụ ụlọahịa bụ ndị gbachiri ebe ndị mmadụ pụtara na-agara onwe ha n'ụzọ.
Foto ndị o setere gosiri mpaghara Waterworks road dị na steeti ahụ.
N'Imo steeti
Obodo Owerri dị n'Imo steeti tọgbọọ chakoo n'ụtụtụ a dịka ọtụtụ mmadụ apụtaghị imepe ụlọahịa ha.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ kwuru na ụfọdụ mmadụ kwuru na odoghị anya ma a ga-enwe sit-at-home nke Ipob taa bụ Mọnde.
Ebe niile tọgbọ chakoo
N'Abia steeti
Ndị mmadụ ekweghị apụta imepe ụlọahịa maọbụ ịga ụlọọrụ ha maka ụjọ na enwerike imerụ ha ahụ.
Ha gwara onyenatakụkọ anyị na ha amaghị ma akagburu 'sit-at-home ' akagbu ka ọ ga-aga n'ihu.
Nke a ga-abụ ụbọchị abụọ a na-eme sit-at-home' n'ala Igbo nke Ipob tinyere bido n'August 9,2021 ruo mgbe gọọmenti Naịjirịa ga-atọhapụ onde ndu ha bụ Nnamdi Kanu.
Ọ bụ eziokwu na Ipob akagbughị iwu 'sit-at-home' nke Ọgọst 9?
Ebe foto si, Getty Images
Kepukepu na-efegharị bụ ba otu Indigenous People Biafra (Ipob) akagbuola iwu ịnọ n'ụlọ ha tinyere na Mọnde 9 Ọgọstụ, 2021.
Akụkọ a sị na onye a kpọrọ Kanunta Kanu a sị bụ nwanne Nnamdi Kanu wepụtara ozi a.
A sị na ihe mere e jiri akagbuo ya bụ maka arịrịọ ndị mmadụ nakwa otu dị iche iche rịọrịọ n'ihi ule NECO nke ụmụakwụkwọ malitere ile.Maazị Kanunta sị ha achọghị ka iwu a metụta ụmụakwụkwọ n'ala Igbo dịka ọganịhụ ha dị ndị otu Ipob mkpa.
Kedụ ihe Emma Powerful kwuru maka sit-at-home Ọgọst 9?
Ebe foto si, Getty Images
Mana BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru otu a bụ Emma Powerful ịmata ma nke a ọ bụ eziokwu.
Emma Powerful sị na akụkọ ahụ na-efegharị na ha kagburu iwu 'sit-at-home bụ akụkọ ugha.
N'okwu ya o si: "Emma Powerful bụ ekwuchaa ọgwu n'okwu mgbasaozi nke otu Ipob, enweghi onye ọzọ ọha kwesiri ige ntị n'ihe ọbụla gbasara mgbasaozi nke otu Ipob"
Ebe foto si, Getty Images
Ọ dọkwara ndị mmadụ aka ntị sị na ha anwakwala anwa pụta ezi n'ụbọchị Mọnde maka ichekwa onwe ha dịka o kwuru na ihe onye ọbụla pụtara hụrụ, ya were. Na nchịkota okwu ya, o kwuru ka ndị mmadụ hapụ itinye aka n'ikposa maọbụ bụte ogbaghara n'etiti otu Ipob.
Cheta na otu Ipob nyere iwu 'sit-at-home' n'ụbọchị Mọnde izuụka ọbụla ruo mgbe a ga-atọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu ndị DSS ji.