Ipob news today: E gburu otu onye ma gbaa ụgbọala ndị mmadụ ọkụ n'Onicha, Ebonyi Steeti

Otu onye anwụọla dịka ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ nọchiri ndị na-eme njem n'okporoụzọ sitere Onicha gawa okpuru ọchịchị ndị ọzọ n'ebonyi steeti.
Ndị akaebe na-ekwu na ndị omekome a nọchịrị ya bụ ụzọ n'ihe dịka elekere isii nke ụtụtụ were wakpoo ndị na-eme njem.
Ndị a kwuru na otu onye nwụrụ na mwakpo a bụ nwoke na-ere efere na ihe eji esi nrị bụ ngwa ahịa ha eme njem mgbe ndị a wakporo ya.
Ha kwuru na egburu nwoke a, gbaa ụgbọala ya ọkụ ma gbaa kwa ụgbọala nke so ya n'azụ.
Kama ndị obodo na-ekwu na ihe a merenụ jịkọrọ iwu ndị Ipob nyere ka mmadụ niile nọrọ n'ụlo n'ụbọchị Mọnde na mpaghara ọwụwa anyanwụ niile.
Ya bụ iwu ndị Ipob nyere bụ iji gosipụta iwe ha dịka gọọmentị Naijirịa jichiri onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.
Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii nọ n'Ebonyi steeti kpụrụ n'ala dịka kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ CP Garba Aliyu ebughị ekwenti ya nke o ji aza ozi anyị zigara ya ruo ugbua.
E gburu otu onye, gbaa otu onye egbe n'aka ma gbaa ụgbọala ise ọkụ na Mbaise, Imo steeti
Ebe foto si, Other
Ụgbọala Libra motors nke ọzụ mmadụ gbara ọkụ n'ime ya
BBC Igbo achọpụtala na ọ bụ ụgbọala ise ka ndị oji egbe amabeghị ndị ha bụ gbara ọkụ na Nkwoogwu-Mbaise dị n'Imo steeti.
BBC Igbo hụkwara ozu otu onye n'ime ụgbọala ahụ.
Otu onye hụrụ oge ihe a mere kwuru na ọ bụ n'ihe dị ka elekere ise nke ụtụtụ ka ihe mere.
O kwukwara na ndị kpara ike a na-ekwu na ọ bụ ụgbọala ndi si Legọs ala ka mwakpo a zutere.
Ebe foto si, Others
Ụgbọla abụọ ụlo ọrụ Libra so n'ime ụgbọala ndị agbara ọkụ. Ọ bụkwa n'ime otu ụgbọala Libra a ka otu onye repịara.
Ebe foto si, Others
Otu bọọsụ njem, ọtụ ụgbọala Sienna nakwa otu Highlander sọkwa n'ihe a gbara ọkụ na mwakpo a.
Ebe foto si, Others
BBC Igbo kpọrọ ụlọ ọrụ njem Libra mana ha sị na ọ bụghị eziokwu na o nwere ihe mere ụgbọala ha, mana ụgbọala abụọ ahụ BBC Igbo hụrụ bu aha ụlọ ọrụ ahụ.
Ebe foto si, Others
Ndị nọ ebe ya bụ ihe mere sị na ọ dịka onwere onye nọ n'ime otu n'ime ụgbọala ahụ gbara ọkụ.
Ebe foto si, Others
Ụgbọla Libra Motors awakporo ma gbaa ọkụ
Onye gwara BBC Igbo okwu kwuru na a gbara otu ọkwọ ụgbọala egbe n'aka mana egbughi ya.
Onwebeghị ihe ndị uweojii Imo steeti kwuru gbasara ya bụ ihe mere.
Okporouzo Aba , Owerri road, Brass street, Park street, nakwa Osisioma tọgbọ chakoo dịka Ipob kanyere iwu 'sit-a-home' taa bụ August 9,2021.
O nwere ebe a na-aghụghị kama otu mkpuru onye.
Park Street tọgbọọ chakoo
Ndị ọkwọ ụgbọala njem hụrụ njọ ahịa
N'Afikpo dị n'Ebonyi steeti ndị ụlọọrụ njem ụgbọala pụtaranụ ahụghị ndị ha ga-ebu mee njem.
Ọtụtụ mmadụ emepeghị ụlọahịa ha ebe ahụ.
Ụmụakwụkwọ pụtara ṅ'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Ebonyi nakwa Abia steeti bia lee ule National Examination Council(NECO).
Ndị isi ụlọakwụkwọ ndị ahụ kwuru na ha malitere ule ahụ n'oge enweghị nsogbu ọbụla.
O nweghị nwataakwụkwọ gbajọrọ ịbia lele ụle ahụ.
A gbara ụgbọala abụọ ọkụ na Mbaise maka sit-at-home? lee ihe anyị
Akụkọ na-ekwu na agbara ụgbọala abụọ ọkụ n'Nkwogwu dị na Mbaise.
Otu n'ime ha bụ ụgbọala Libra e chere bu ndị si ije abalị abata, agbara ya na ọkwọ ụgbọala nọ n'ime ya ọkụ.
Anyị ka na-enyocha ka anyị chọpụta etu ya bụ mkpa si kpaa.
Ahia Ekeonunwa dị n'Owerri zụrụ taa agbanyeghị iwu sit -at-home -order Ipob tinyere.
Ndị bi n'Afaraukwu pụtara na-aga mkpa ha
Ndị mmadụ pụtara ọfụma n'Afaraukwu na-aga mkpa ha
Ndị bi n'Afaraukwu dị n'Abia steeti mabụrụkwa ebe Nnamdi Kanu si, pụtara na-aga mkpa ha dịka Ipob tinyere 'sit-at-home order'.
Onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ahụ kwuru na ndị mmadụ gwara ya na ha pụtara n'uju makana o dọghị ha anya ma ya bụ mmachị a ga-aga n'ihu ka ọ gaghị aga n'ihu.
Lee etu ebe ahụ dị ugbua na foto dị n'elu.
N'Ebonyi steeti, ọtụtụ ụlọakwụkwọ emepeghị, ndị mmadụ adịghị ọtụtụ na-aga n'ụfọdụ okporoụzọ.
Ebe foto si, BBC
Ụfọdụ ụlọahịa mechiri emechi n'Ebonyi steeti
Ahia Old Artisan dị n'Enugu tọgbọọ chakoo
Ahia Old Artisan dị' Enugu tọgbọrọ chakoo
Ụlọahịa dị n'okporoụzọ Njemanze dị n'Enugu agbapeghị
Okporoụzọ Njemanze, Enugu
Etu ihu na anya dị ọtụtụ ebe n'Awka, Aba na Owerri
Ọtụtụ ebe n'ala Igbo adịchaghị ka ha si adịbu dịka ndị mmadụ apụtaghị maka sit -at-home order Ipob tinyere n'ala Igbo.
Foto dị a gosiri ka Aroma junction dị n'Ọka dị n'ụtụtụ a.
Ụfọdụ mmadụ gwara ndị ntaakụkọ anyị na ọ bụ ụjọ na nkwụcha mere ka ha gharị ịpụta bia chọọ ihe na ezinụlọ ha ga-eri.
Lee ka Eke ọka dị n'ụtụtụ a
Ụfọdụ ụlọakụ emepeghị n'Awka
Ụlọakụ dị n'Ziks Avenue, Awka
Wethral Road Owerri
Ipop gbadoro ụkwụ n'ala na mmachị ngagharị a ga-aga n'ihu
Ebe foto si, Getty Images
Taa bụ ụbọchị mmalite iwu ịnọ n'ụlọ nke Ipob sị na a ga na-eme n'ụbọchị Mọnde kwa izuụka ọbụla ruo mgbe a ga-atọhapụ Nnamdi Kanu.
Onyeisi otu a na-anọchi anya Kanu bụ Chika Chidoziem nyere iwu a ma sị na ọ bụrụ na Kanu enweereghi onwe ya na ha agaghị ezu ike.
N'agbanyeghi na ndị ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ akatọọla atụmatụ a tinyekwara akụkọ sị na Ipob 'akagbuola' ya.
Mana Chidoziem wepụtara ozi ma sị na o nweghi mgbe ha kagburu ya bụ atụmatụ a na ọ ga-adị ka ha si kwuo.
Ebe foto si, Ipob
BBC Igbo kwụ chịm i wetere gị ka o si aga na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ. " A ṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa".