Anambra news today: Ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndi uweojii na Nnewi

Ebe foto si, AFP
Ndị uweoji ebidola nyocha ihe gara na Zamfara steetị
Tochukwu Ikenganya bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra Steetị gwara BBC Igbo ndi oji egbe chọrọ ịwakpo ụlọ ọrụ ndị uweojii na Nnewi mana achụchiri ha azụ.
Dịka o siri kwuo, Maazị Ikenganya sị na ha ka na-eme ka ha mata etu ihe a siri mee mana ọ sị na obodo ahụ adaala juu.
Ọ gwakara BBC Igbo na ọgbaghara dapụtakwara na mpaghara Izuchukwu junction, Nnewi nọ na Anamabra Steetị mana ha enyochapụtabeghị ma agbagburu mmadụ ebe ahụ dịka ha ka na-eme ọrụ nyocha ha.
Mana akụkọ n'erụ BBC Igbo nti kwuru na a gbagburu ihe ruru mmadụ abụọ na mpaghara ahụ.
BBC Igbo enwetachabeghi akaebe etu ha bu ihe siri mee.
BBC Igbo ka na-achọ inwete akaebe maka ihe a mere, mana ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ na-ede na ọ bụ ọgbaghara n'etiti ndị agha na ndị pụtara gbachie ụzọ maka atụmatụ "sit-at-home" otu Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere butere mgbagbu mmadụ a.
Ndị agha bupuru ihe ndị e ji gbachie ụzọ ebe ahụ.
Akụkọ ka na-abịa