Lee foto ọhụrụ si ụlọọgwụ rekara ereka n'Abia steeti

Ụlọọgwụ ahụ dị na Ndịelu

Gọọmemntị Abia steeti esila n'ọnụ Promise Uzoma Okoro bụ osote onyeisi okpuruọchịchị Bende etinyela ọnụ n'okwu akpụ n'ọnụ.

Nke a bụ gbasara otu ụlọ ejiri mere ụlọọgwụ n'obodo Ndielu Ugwueke foto gosiri ebe o rekasịrị erekasị nke ndị mmadụ katọkwara.

Uzoma kwuru na ọ bụ afọ ise gara aga ka akpọnyere ndị obodo ahụ dọkịnta na ndị nleta iji na-eleta ha ahụ n'oge mberede.

"Ọ bụ Townhall ka ị na-ahụ na foto ahụ, ọ bụghị ezi ụlọọgwụ ka ọ bụ" ka o kwuru.

"Ndị Ugwueke gwara ndị ọrụ ahụike na ha chọrọ ụlọọgwụ ga-adị ha nso n'ihi na ịsị Amaeke gawa Amagba maka ụlọọgwụ rara ha ahụ" ka ọ kọwakwara.

Ihe ọzọ Uzoma kwuru na ngwa ọgwụgwọ ndị dị ebe ahụ bụ nke ejibu eleta ndị mmadụ n'oge gara aga nke ebupubeghi kemgbe.

"Mụ na ndị ọrụ ahụike na-ekwu ugbua, a ga-ebupu ngwa ndị ahụ n'oge adịghị anya" ka o kwuru.

Ihe BBC hụrụ mgbe anyị gara ebe ahụ

Ndị ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ ịme nchọpụta ma hụ na ebe ahụ bụ ụlọ ochie agbahapụrụ.

Ndị mmadụ nọ n'akụkụ ebe ahụ kwuru na o nwere otu nwaanyị onye nleta na-abịa ebe ahụ enyocha ndị mmadụ ma na-eziga ha ụlọọgwụ ukwu maka ọgwụgwọ.

Anyị hụrụ gbam gbam ebe mmiri si ehi ehi nakwa ụfọdụ ngwa ọgwụgwụ n'ime ụlọ ebe ahụ.

Ndị obodo ahụ gwakwara anyị na-enwere ụlọọgwụ abụọ ndị ọzọ abụghị nke gọọmentị dị n'obodo ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị