Open grazing ban: Anyi anataghị Buhari ijeri naịra isii maka ịchị ehi n'Ebonyi - Umahi

Buhari na Umahi

Ebe foto si, facebook.com/femi.adesina

Aka na-achị Ebonyi Steeti bụ David Umahio ekwuola na ọbụghị eziokwu na ya natara gọọmenti Naijirịa ijeri naịrị isii maka atụmatụ ịchị ehi na steeti ahụ.

Umahi kwuru nke a n'ozi si n'aka Francis Nweze bụ onye enyemaka ya n'ihe banyere mgbasa ozi binyere aka.

Maazị Nweze sị na onweghị oge gọọmentị Ebonyi natara gọọmentị Naịjirịa ego maka ịzụ ehi dịka ọnụ na-ekwuru Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Naịjirịa kwuru na mkparịtauka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels TV mere.

Garba Shehu kwuru na mkparịtauka ahụ na Ebonyi Steeti na steeti abuo ọzo so na ndị natara ego maka ịzụ ehi n'atumatu Bekee kpọrọ Ranching.

Mana Maazị Nweze sị na nke ahụ abụghị eziokwu makana steeti ahụ enweghị ala maka atụmatụ ahụ.

Ọ sị: "Anyị anula akụko na-efesgharị na Ebonyi so na steeti natara ego maka ịzụ ehi nke a sị na Garba Shehu kwuru, mana n'iji doo ndị mmadụ anya, onweghi oge Ebonyi natara ụdịrị ego a makana anyị enweghị ala maka atụmatu a."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na na ya bụru na onye Ebonyi ọbụla chọrọ ịzụ ehi, onye ahụ kwesiri ịhụ ya dịka achụmta ego nke aka ya ma jiri ala nke ya mee ya.

Ihe ọzọ o kwuru bụ na Onweghi ihe ga-eme ka Ebonyi gbanwee ebumnuche ha na owneghi ala ọbụla ha nwere maka ịzụ ehi.

Pati People Democratic Party nke steeti ahụ si na ha nụrụ ebe Garba Shehu kpọrọ Ebonyi aha dịka steeti natara ego ịzu ehi.

Ha si na ya bụ ihe tụrụ ha n'anya maka na ha amaghi etu ụdịrị ego ahụ ga-abata Ebonyi onweghi onye ga-ama maka ya.

PDP na-achọ ihe ekwe maka ya weta ya bụ ego. Ha jụrụ: "Ọ bu maka ịzu ehi nke ndi mmadụ ga-eme.

N'ozi PDP wepụtere, ha gakwara n'ihu kwuo na Ebonyi so na steeti ndị adịghị eme ọfụma n'atumatụ Bekee kpọrọ "fiscal responsibility".

Cheta na gọvanọ ndị steeti niile dị na Ndịda Naịjirịa ekwuola na aka ha anabataghịzị ịchị ehi na-agagharị nke Bekee kpọrọ "open grazing".

Ọ bụ n'ụbọchi 21 nke ọnwa Mee ka ndi Gọvanọ Ndịda Naịjirịa nwere nkwekọrịta a n'Asaba bụ isi obodo Delta steeti.

Gọọmentị Naịjirịa, site n'okwu ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Ababukar Malami, anabataghị ihe gọvanọ ndịda Naịjirịa mere.