'Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia egosighị ebe mu na Uche Maduagwu kpere udo' - Jim Iyke

Jim Iyke

Ebe foto si, Jim Iyke Instagram

Na mkparịtaụka BBC Igbo na onye ejije "Nollywood" a ma ama bụ Jim Iyke mere ọ kọwara na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia egosighị ebe ya na Uche Mmaduagwu kpere udo.

Jim Iyke kwuru na ya gara zute Maazị Maduagwu maka ihe o mere kpasuru ya ịwe n'ihe ọ bụ ihe nwere ikike imetọ aha ọma ya ma meetọ ihe ejije ọhụrụ ya.

O kwuru na n'ezia njem nleta ọ gara ileta Maazị Mmaduagwu bụ maka udo na ọ bụghị maka ọgụ mana ka ihe si mee na mbido ezigbo ịwe ebubo o boro ya nakwa etu o si zaa ya ajụjụ mere o ji chọọ iti ya ihe.

Ọ gara n'ihu kwu na ya na Uche Mmaduagwu kpere udo n'okwu ahụ.

O kwukwara na Maazi Maduagwu sị na ọ bụghi olileanya ya ebute ọgụ mana, ọ bụ ihe egwuregwu na ihe ọchị ọ na-eme na soshal midia kpara ya ji kwuo ihe o kwuru.

Ị ma etu Jim Iyke si akpata ego?

Dịka Uche Maduagwu boro Jim Iyke ebubo na o si n'ụzọ aghọghọ na nke na-ezighi ezi kpata ego, BBC Igbo jụrụ ya nke bụ eziokwu n'okwu a.

Jim Iyke kwuru na okwu a bụ ezigbo ugha, ọ gara n'ihu kwuo ọrụ aka ole m ole o ji ugbua nke gụnyere: Ụlọọrụ na-ahazi njem, Ụlọọrụ Teknzụ, Ụlọ ọrụ na-ebugharị ngwo ngwo ndị mmadụ, Ụlọ ezimike 'Airbnb' kariri anọ, Ụlọọrụ na-ere akwa na ihe ejiji.

Aha onyonyo,

'Anwụ na-achagbu anyị na Nollywood' - Uwaezuoke

N'okwu ya o si "Ebidoghi m taa kpatawa ego, ọ bụghị ihe niile ka mmadụ na-etinye na soshal midia.

Mgbe m dị afọ iri abụọ na otu ka m bidoro mewa ihe onyonye na ihe ejije Nollywood"

O kwukwara na o tinyela ụchụ na ihe ejije ọ na-eme nke gụnyere i ga njem n'ofesi gaa guo akwụwkọ banyere ikata ego na ihe ndị ọzọ nyiri ya.

Jim Iyke duru ndị ntọrọbịa chọrọ ịrụ ọrụ ihe ejiji ndụmọdụ ka mara na ọ bụghị sọ ihe egwuregwu ma ọ bụ ezigbo ihe ahịa a na-etinyere ụchụ eme.

Ihe onyonye a nọ n'etiti Uche Maduagwu na Jim Iyke, ọ bụ ihe egwu i ji kwalịte ejije ọhụrụ Jim Iyke?

Jim Iyke gwara BBC Igbo na ihe a mere abụghị ihe nkwado ejije ọhụrụ ya nke aha ya bụ 'Bad Comment', ma ka ihe si mee, ọ mere na ndabanye na ihe mere metụtara isi okwu ejije ya.

Ọ kọwara anyị na ihe kpatara o ji mee ejije a bụ agwa ọjọọ ole m ole ndị mmadụ kpasara ya na soshal midia nakwa ndị ọzọ ọ ma.

Aha onyonyo,

'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo

Ọ tụpenyere BBC Igbo azụ ndị a ma ama nọ n'ime ihe ejije a, ụfọdụ n'ime ha bụ: Chewetalụ Agu, Young Jon (the Wicked Producer), Timaya , Desmond Ellitot, Rugged man, Francias Duru , Ay The Comedian, Warri Pikin, dgz.

Ọ Kọwara BBC Igbo na ejije a pụtara n'ụlọ ihe onyonyo bekee na-akpọ 'cinemas' ugbua, o kwukwara na ọ ga a pụta n'ihe teknzu 'Netflix' ne-ebe ọnwa Dịsemba.

Na nchikọta, ọ rịorịọ ndị ntorobia arịriọ ka ha na-akwado ihe ejije 'Nollywood' etu ha si akwado nke ndị bekee na ndị Ịndịa.

O kwukwara na ime ihe ejiji na Naijịrịa adịghị mfe dịka gọọmentị anaghị etinye aka na-ikwado ihe ejijie etu ndị bekee na ndị mba ọzọ si eme.