Mamady Doumbouya: Onye bụ ọchịagha ndị Guinean chụpụrụ Alpha Conde?

Colonel Mamady Doumbouya

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

Nkọwa foto,

Colonel Mamady Doumbouya kwuru okwu na Onyeisiala mba Guinea bụ Alpha Conde nọ ebe ha dowere ya dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha nọrọ be ha.

Ọ bụ site n'ihe onyonyo e bipụtara na ịntaneetị ka Lieutenant-Colonel Mamady Doumbouya dọtara mmasị ọha.

Ọ mara ọkwa na ya jidere onyeisiala mba Guinea na redio.

Lieutenant-Colonel Mamady Doumbouya, onyeisi otu ndị agha Guinean Special Forces Group, wetara nlebara anya ọha site na vidiyo ezipụrụ na ịntaneetị

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

"Oge ndị mmadụ ji ndọrọndọrọ ọchịchị agaala. Anyị ga-edobe ngbanwe doro anya nke onye ọbụla ga-eso," Doumbouya kwere nkwa.

N'afọ 2018 ka Lieutenant-Colonel Mamady Doumbouya bụbu onye ọchịagha nke ndị agha France rigoro n'ọkwa onyeisi agha mba Guinea na 2011.

Ọ malitere dịka onye nkuzi n'ogige km 36 na mpụga Conakry, isi obodo ha.

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

Site ebe ahụ gaa Kindia 135km site na Conakry.

Ọ bụ Alpha Condé bụ onye buliri ya n'ọkwa dịka onye isi ndị agha ndị agha Guinean na 2018.

Ọrụ ya bụ idu ndị otu agha pụrụiche e ji ebuso ndị omekatara ihe pụọ ụjọ agha na Guinea.

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

Nwoke ahụ dọtara uche ndị mmadụ mgbe ha zọrọ njem ngosi ndị agha n'Ọktoba 2002, ụbọchị ezumike nnwere onwe nke mba ahụ.

Ya na ndị otu ya niile kpuchiri isi ha mere ngosi pụrụiche ụbọchị ahụ.

Ọ gakwara ọzọ dịka onye ọrụ nchekwa pụrụiche na Academy of International Security dị na Israel, gakwa ọzụzụ nke ndị isi na Ecole d'application de l'infantry (E.A.I. - Thiès Senegal), nakwa ndị isi (E.E.M.L. - Libreville) and the Paris War School.

Ebe foto si, European Pressphoto Agency

N'ime afọ 15 ọ ji bụrụ onye agha, Doumbouya arụọla ọrụ na mba Cote D'Ivoire, Djibouti, Central African Republic, Israel, Cyprus, na United Kingdom.

Ụda egbe na-ada na Guinea dịka ndị agha nwuchiri Alpha Conde?

Ebe foto si, AFP

Ndị nchekwa pụrụiche apụtala kwuo na ha ewepula onyeisiala mba ahụ bụ Alpha Condeh n'ọkwa.

Cheta na ihe onyonyo na-efegharịbu ebe niile gosiri ebe ụfọdụ ndị nchekwa mba abụ jichiri ya n'ime ụgbọala nakwa n'otu ụlọ.

Ndị ahụ kpọrọ onwe ha "National Committee for reconciliation and development" pụtakwara n'onyonyo zie ndị mba ahụ ozi.

Ha tara mpụ, nrụrụaka, ụbịam, nakwa enweghi ezi nhazi na mba ahụ ụta maka ịnapụ ọchịchị n'ike mere n'ụbọchị ụka n'ebe ahụ.

E kwukwara na ndị isi nọ na gọọmentị nọkwa n'okpuru ndị nchekwa pụrụiche nke ọchịagha Mamady Doumbouya nọ n'isi ya.

Ebe foto si, AFP

Minista nchekwa nke mba ahụ ekwuola na ha kwụsịrị ndị ahụ na-akwa mgbọ na gburugburu ebe obi gọọmentị ha dị.

Ugbua ndị agha na-agagharị n'okporoụzọ n'isi obodo ahụ nke ndị mmadụ anọghịzi na ya.