IPOB arrest Ghana: Ihe mere Ipob jiri arịọ gọọmentị mba ahụ biko

Ndị otu Ipob anwụchiri ụfọdụ n'ime ha

Ebe foto si, Emeka Gift/Ipob Ghana

Otu Ipob esila n'ọnụ otu onye n'ime ha bụ Emeka Gift rịọ gọọmentị mba Ghana arịrịọ ịtọghapụ ọtụtụ n'ime ha ejichiri n'Accra.

N'ozi o depụtara na Facebook ya Emeka Gift gwara Nana Akufo-Addo na "ndị ezinaụlọ Ipob nke ndị uwoejii be ha tọọrọ bụ ndị na-achọ udo".

Cheta na akụkọ gbọwara na anwụchiri ụfọdụ ndị otu Ipob n'izuụka gara aga n'Accra mgbe ha na-eme nzụkọ n'ebe ahụ.

Mana o nwebeghi ihe ndị uweojii mba ahụ kwuru maka nke a rue ugbua.

N'ozi ahụ Gift gwara onyeisiala Akufo-Addo na ndị ahụ anwụchiri bụ ndị so ekpocha azacha ebe ha bi bụ Accra.

"Anyị na-arịọ gị tọghapụ ndị anyị na o nweghi iwu ha dara" ka o dere.

Gịnị mere eji nwuchie ha?

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

Akụkọ pụtara kwuo na ndị uweojii mba Gana nwụchiri ndị Ipob n'Accra dịka ha na-eme nzụkọ ọnwa ha.

O nwekwara ihe onyonyo na-efegharị nke ndị mmadụ na-ekwu bụ ndị Ipob ahụ nọ n'ime ụgbọala agụ egwu.

Rue ugbua, o dobeghi anya ihe mere e ji nwuchie ndị Ipob ahụ.

N'otu aka ahụ ndị isi Ipob bụ DOS wepụtara ozi na-ekwu na ha na-agbasị mbọ ike ịgbapụta ndị ahụ ejichiri na mba Gana.