Young Akuwuodor: Ụlọikpe enyeghachila nwaanyị Ajadu na ezinaụlọ ya ụlọ ha

Young Akuwuodor: Ụlọikpe enyeghachila nwaanyị Ajadu na ezinaụlọ ya ụlọ ha

Ihe atụgharịala otu ezinaụlọ dịka ụlọikpe nyere ha ikike ịlaghachi n'ụlọ ebe Young Akuwuodor chụpụburu ha.

Ezinaụlọ Reginald Akuwuodor bụbu ndị nwanne nna ha bụ Young chụpụrụ n'ụlọ mgbe gara aga.

Ha n'ọzị n'ọnọdụ ọṅụ ugbua dịka ha na-alaghachi be ha ma na-ahazi mbara ezi ebe ahụ.

Nkọwa foto,

Ụlọ ebe esemokwu malitere

Cheta na onyonyo ebe otu nwa agbọghọ na-ebe akwa maka etu ndị ọkaiwu si atụpụ ngwogwo ya na nne ya n'ụlọ nna ha so wee biri n'obodo ha na-efegharị na soshal midia.

Mgbe ahụ, BBC Igbo gara gbaa ya na nne ya nakwa nwanne ya bụ Young Akwuwodor maka nsogbu a dapụtara na bee ha.

Kirie ihe ha kwuru n'uju n'onyonyo a dị ebe a.

Akụko ndị ga-amasị gị: