Ipob sit at home: Mkpu akwa na-ada n'ụlọ Emeka Merenu, ụkọchukwu Anglịkan e gburu n'Orsu Imo steeti

Emeka Merenu
Nkọwa foto,

Ndị ụkọchukwu na ndị mmadụ gbakọrọ na be Ụkọchukwu Emeka Merenu, onye ndị ekperima gburu n'Orlu

Mkpu akwa na-ada n'ebe niile n'ezinụlọ ụkọchukwu Emeka Merenu, bụ ụkọchukwu ụka Anglịkan ndị omekome gburu n'Imo Steeti n'ụbọchị Tusde.

BBC Igbo gara n'Amaorji Nkwere, bụ obodo ụkọchukwu Emeka Merenu, iji mata etu ebe ahụ siri dị.

Ọtụtụ ndị ụkọchukwu gbakọkwara ebe ahụ na-akpa ihe ọzọ ha ga-eme.

Otu onye gwara onye ntaakụkọ anyị okwu kwuru na ụka Anglịkan nke Dayọsis Orlu akpọrọla ezinụlọ ụkọchukwu ahụ.

O kwuru sị: "A kpọgala ha ebe a ga na-eleta ha anya," mana onweghị onye me ebe ahụ iji chekwaa ha.

Ka ọ dị ugbua, ebugala ozu ụkọchukwu Emeka n'ụlọ ozu ebe ọ ga-anọ ruo ụbọchi olili ya.

Etu e si gbuo ụkọchukwu Emeka Merenu n'Orsu Ihitte-Ukwa

Ebe foto si, Chidiebube Okuoma

Nkọwa foto,

Emeka Merenu bụ onye Amorji Agbomiri Village in Nkwerre

Akụkọ ruru anyị nti na-ekwu na e gburu otu ụkọchukwu Anglịkan nke St. Andrew's nọ n'Ihitte Ukwa di n'Orsu nke Imo Steeti.

Onye ụka ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'isi ụtụtụ ụbọchị Tuzde ebe ndị omekaome wakporo ụlọ ụkọchukwu ahụ nke nọ n'ime ụlọụka St. Andrew's ma gbuo ya.

Ọ gwara BBC Igbo na aha ụkọchụkwụ ahụ bụ Emeka Merenu onye Amaorji Nkwerre dị n'okpuruọchịchị Nkwerre nke Imo Steeti.

O kwukwara na ndị omekaome kpara mkpa mkpa a, gbakwara ụgbọala ụkọchukwu ahụ ọkụ.

Otu onye ji ọkwa riri elu na Diyọsis Anglịkan nke Orsu na-achọghịkwa ka a kpọọ aha ya kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.

Aha onyonyo,

Ihe ise ga-akwụsị sit-at-home a Ipob na-eme – Elliot Uko

BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steetị bụ Michael Abattam, ọ sị na ihe ndị a mere n'ezie mana nnyocha na-aga n'ihu ịchọpụta ka o si mee nakwa inwuchi ndị kpara arụ a.

N'akụkọ yiri ya ihe onyonye na-efeghari na soshal midia gosiri mmadụ atọ a si na ndị omekaome gbukwara ma tọgbọ n'okporoụzọ Orsu na Tuzde.

Etu e si wakpoo ndị mmadụ na Nanka, Emene nakwa Awka na 'sit at home' taa

Ebe foto si, Screen grab

Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere iwu 'sit at home' n'Ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị 14 Septemba, 2021.

Ha sị na ọ bụ maka ncheta ndị otu ha a sị nwụrụ mgbe ndịagha wakporo ụlọ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu n'afọ 2017.

Iwu a ebuterela ụfọdụ ihe ọdachi dịka a wakporo ndị mmadụ n'ebe dị iche iche dịka Nanka, Emene, Orlu nakwa Awka.

Emene, Enugwu Steeti

Ebe foto si, Screen shot

Ọgbaghara dapụtara n'Emene, Enugwu Steeti n'oge a na-eme ọnọdụ ịnọ n'ụlọ nke otu Ipob tinyere n'ụbọchị 14 Septemba, 2021.

Otu onye bi n'oge ahụ gwara BBC Igbo na ọ ndị ntoroọbịa gbara otu ụgbọala na-ere achịcha ọkụ maka ịda iwu 'sit at home'.

Ọ sịkwara ndị ọzọ a maghị ndị ha bụ nọ na-agba egbe aghaghara ma were mma na ngwa ọgụ ndị ọzọ na-alụ ọgụ na mpaghara Orie Emene.

O kwuru na ebe niile adaala jụụ ugbua dịka ndị ọrụ nchekwa na-akpagharị ugbua.

BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu n'ekwentị ya mana ọ sị ka a kpọghachị ya azụ n'ihi na ọrụ jụrụ ya aka ugbua.

Nanka, Anambra Steeti

Ebe foto si, Screen grab

Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti akọwaala ka ndị omekome si wakpoo ụgbọala n'obodo Nanka dị na steeti ahụIkenga gwara BBC Igbo na ha natara ozi maka ọgbaghara dapụtara ebe ahụ n'ụtụtụ Tuzde.

Ọ sị na ndị omekome chuturu ndị nọ n'ụgbọala nakwa keke na-agba n'okporoụzọ si Nanka gawa Oko ma gbaa ha ọkụ mana onweghi onye nwụrụ.

Ikenga sị na ndị uweojii ewerela ọnọdụ ebe ahụ ugbua dịka nyocha na-aga n'ihu.

N'Awka, Anambra Steeti

Ebe foto si, Screen copy

N'akụkọ yiri ya, ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka e si wakpoo ma gbaa otu keke ọkụ n'Awka, Anambra Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ezie mana ha agbanyụọla ọkụ ahụ ma weta ncheka n'ebe ahụ.

Ihe ndị bi n'Emene, Enugwu kwuru maka ụda egbe a sị na a nụrụ ebe ahụ

Nkọwa foto,

Emene, Enugwu (Foto esebụrụla n'oge gara aga)

Akụkọ na-ekwu na ọgbaghara adapụtala na mpaghara Emene, Enugwu ebe a si na-anụrụ oke ụda egbe.

Ụfọdụ mmadụ kwukwara na agbara otu ụgbọala bu achịcha ọkụ ma chụsasịa ndị mmadụ pụtara n'ọdọ ebe a na-ere nrị na mmanya, chụla ha ụlọ.

BBC Igbo natara ozi n'aka ndị bi n'Emene, ha si na ha anụghi ụda egbe ọbụla mana enweghi ngwere maọbụ oke pụtara ezi taa dịka ebe niile tọgbọ chakọm.

Ka akụkọ a na-apụta, BBC Igbo kpọturu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu n'ekwe ntị ya mana ọ zaghị.

Aha onyonyo,

Ihe Simon Ekpa gwara BBC IGbo maka ọchụchụ nwere onwe Biafra

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ dịka ha na-erube isi n'atụmatụ nọrọ n'ụlọ nke otu na-achọ nnwereonwe bụ Ipob wepụtara iji cheta ụbọchị ha sị na ndị agha Naịjiria wakporo ụlọ Nnamdi Kanu bụ onye ndu ha.

Nke a emeela ya ugboro atọ n'ime ihe na-erughi otu izu Ipob na-etinye iwu nọrọ n'ụlọ a n'ihi atụmatụ dị iche iche.

Ndị nta akụkọ BBC nọ na steeti ise dị n'Ọwụwa anyanwụ kwuru ji foto nakwa onyonyo ha setere ebe ndị wee gosi ka ihe si kwụrụ.

N'Owere, Imo Steeti

Nkọwa foto,

Owere, Imo Steeti

Ka o si dị n'ụtụtụ taa bụ Tuzde n'Owere, Imo Steetị, ebe niile nọ jụụ, ndị mmadụ apụtaghị ezi, ahụghịkwa ọtụtụ ụgbọala ọbụla n'ebe ahụ.

Nkọwa foto,

Owere, Imo Steeti

Ụlọ Nnamdi Kanu n'Afaraukwu

Ọtụtụ mmadụ nọ n'ụlọ n'Afaraukwu ebe ụfọdụ nọ na-akparịtaụka gbasara sit at home nke taa Ipob hibere nakwa etu ọ ga-esi metụta akụ na ụba ha.

Ahụghị ọtụtụ mmadụ n'ụzọ n'Afaraukwu dịka okporoụzọ niile tọgbọọ chakoo.

N'Umuahia

Ụlọakụ, Ụlọakwụkwọ nakwa ahịa dị ịche ịche emepeghi na mpaghara Umuahia dịka ndị mmadụ no n'ụlo taa.

Nkọwa foto,

Umuahia, Abia Steeti

Nkọwa foto,

Umuahia, Abia Steeti

N'Enugu,

Ndị mmadụ nọọ n'ụlọ n'Enugu ta a bụ ụbọchị Sepụtemba 14, 2021.

Onyentaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ọtụtụ ụlọahịa, ụlọakụ, ụlọakwụkwọ emepeghị emepe.

BBC Igbo chọpụtara na ọnụ ahịa nri na ihe ndị ọzọ a na-eregasị gbagoro elụ.

N'Anambra,

Ndị mmadụ apụtachaghị etu ha si apụta n'ebe akpọrọ Aroma Junction dị n'Awka bụ isi obodo Anambra steet.

Ebe foto si, BBC

A hụghị kama otu onye n'okporoụzọ ebe akpọrọ Authur Eze Junction dị n'Awka.

N'Ebonyi

Ndị mmadụ apụtaghi ezi taa n'Ebonyi dịka ebe ahịa dị iche iche, ụlọakụ, nakwa ụlọakwụkwọ emepeghi maka iwu ịnọ n'ụlọ a akpọrọ sit at home.

Lee foto gosiri ka ebe ahụ dị

Nkọwa foto,

Ebonyi Steeti

Nkọwa foto,

Ebonyi Steeti

Ihe mere Ipob ji tinye sit-at-home nke taa- Emma Powerful

Ebe foto si, Kanu Facebook/BBC

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra ekwuola na ọ bụ maka ịcheta etu ndị agha Naịjirịa si wakpoo bee onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu n'afọ 2017 mere ha hibee sit-at-home nke taa.

Powerful kwuru na atụmaatụ nnọrọ n'ụlọ nke taa bụ kwa maka icheta ndị otu ha o kwuru nwụrụnụ na ya bụ mwakpo.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na aka Ipob adịghị na mwakpo niile na-eme n'ụbọchị Mọnde kamgbe otu ahụ kwuru ka akwụsị atụmaatụ onye nọrọ n'ụlọ ụbọchị Mọnde.

Powerful kwụrụ na onye ọbụla gara n'ihu nupu isi maka sit-at-home nke taa bụ September 14,2021 jị aka ya akpọ ọnwụ ya.

N'ọnụ ya, "ọ bụghị Ipob ga-egbu ha."

"Anyị na-emebu atụmaatụ nnọrọ n'ụlọ kwa afọ ọbụla kamgbe awakpochara ụlọ onye ndu anyị, amaghị m ihe nke afọ a ji pụọ iche."

Cheta na ndị ọtụtụ mmadụ ka na-anọ n'ụlọ n'ụbọchị Mọnde n'ala Igbo makana ụfọdụ gwara BBC Igbo na ụjọ ji ha ịpụta maka mwakpo, ebe ụfọdụ kwuru na ha na-emere ya onwe iji ikwado Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ DSS kamgbe ọnwa abụọ n'ụma.

Ebe foto si, BBC

Gịnị mere n'Afaraukwu n'ọnwa September, 2017?

N'ụbọchị Sepụtemba 12, 2017 ka ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Pidgin na ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ Nnamdi Kanu dị n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

Ejiofor kwuru na ndị agha ahụ gbara bee Kanu okirikiri nakwa ọdịka ejichiri Kanu na bee ya ụbọchị ahụ n'atụmaatụ ọkpọrọ 'House arrest ' na bekee.

"E nweterem oku si n'aka Nnamdi Kanu n'ekwenti mana ugbua anaghị m enwetezi n'ekwenti ugbua, ihe nwere ka ọ dị ugbua, bụ ihe ọ gwara BBC news Pidgin ụbọchị ahụ.

Ejiofor kwukwara na ndị agha Naịjiria nwụchịrị ndị otu Ipob gara ileta Kanu n'ụlọ.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa mgbe ahụ bụ Brigadier General Sani Kukahsheka Usman gwara BBC na ihe niile Ejiofor kwuru bụ asị.

Otu ụbọchị ahụ ka otu Nigeria Union of Journalists, NUJ, Abia State chapter kwukwara na ndị agha wakporo ụlọọrụ ha dị n'Umuahia.

Comrade Christopher Isiguzo, bụ osote onyeisi otu ahụ nke Zone C, South East, gwara BBC News Pidgin na ndị agha wakporo ndị ntaakụkọ n'Umuahia mebie ngwaọrụ ha , ekwenti, igwe e ji ese foto ma tie ụfọdụ n'ime ha ihe.

Ha kwukwara na ndị agha ahụ biara wakpoo ụlọọrụ ha maka ha chere na ndị otu ha si n'ụlọọrụ na-ese ha foto.

Akụkọ ka na-abịa