Ukpabi Asika biography: Ukpabi Asika: Ochie dike Igbo kwenyere na ịnọ na Naijiria kara Igbo mma karịa Biafra

Ukpabi Asika

Ebe foto si, Obi Asika

Ọ bụrụ na ọ dị ndụ taa, o nweghị onye ma ma Ukpabi Anthony Asika gaara adị afọ iri asatọ na ise (1936-2004) a kaara akwụgide na nkwenye o nwere oge a lụrụ Agha Biafra.

N'oge agha, Asịka so n'otu onye welitere isi na Naijiria bụ nwa afọ ezoghị onwe ya n'ikwupụta nkwenye o nwere na ọnọdụ Igbo kaara ha mma na Naijiria, karịa ikewapụta mba nke aka ha bụ Biafra.

Kedụ ihe ị ma maka ya? Kedụ ihe e jii echeta nwa afọ Onicha, Anambara steeti a?

Mgbe ọ dị ndụ, Asika bụ onye nkuzi, onye ọrụ Bekee nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Kedụ ihe a kacha eji echeta ya taa?

Ebe foto si, Ed Keazor

Dịka onyeisi (gọvanọ) mpaghara a kpọrọ 'East Central State' n'oge ọchịchị ndị agha; site n'ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba 1967 ruo Julaị 1975, Asika na-akpoku ndị Ọwụwa Anyanwu ochie ka ha wụsa ngwaọgụ ịchọ Bịafra, bia ka Gọọmentị nyere ha aka.

Ọ nọchiri Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu dịka gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mgbe Ojukwu durula ndị Biafra n'agha nnwereonwe ha n'aka Naịjiria.

N'oge ọ chịrị, naanị Asika bụ onye Igbo nọ n'ọkwa Gọvanọ na Naịjiria, bụ ihe so mee ka ụfọdụ ndị Igbo kpọọ ya 'sabo' n'ihi na ọ zara oku ọchịchị Yakubu Gowon bụ onyeisiala mgbe ahụ kpọrọ ya n'agbanyeghi na ndị Igbo nọ n'agha.

Ebe foto si, Ed Keazor

Nkọwa foto,

Ukpabi Asika na Ọchịagha Yakubu Gowon n'afọ 1967

Mana ọ bụ 'sabo'?

Otu ihe Asika kwenyere na ya mgbe ọ dị ndụ bụ na "Naịjiria ịdị n'otu bụ maka ọdịmma onye ọbụla", o kwenyekwara na ịlụ agha adịghị mma, mere ka ọ na-ede akwụkwọ gbasara ịkwụsị ya bụ agha Biafra.

N'ihi ihe ndị ọ na-ede, Ọchịagha Gowon rịọrọ Asika bụ onye nkuzi na mahadum Ibadan ka ọ bịa chịwa steeti ndị e kewapụtara na ndị na-achọ nnwereonwe Biafra.

Ọ dị naanị afọ iri atọ na otu (31) mgbe ọ malitere ịchị ya bụ 'East Central State'.

Ka ọ banyere ọchịchị, o jiri ọkwa ya na-arịọ sị na ịlụ agha abụghị ụzọ ka mma isi enweta ihe a na-achọ. Otu ihe o kwuru anaghị echefu echefu bụ "...mana anyị ekwesịghị ichefu na ọ bụ ndị mmadụ na-anwụ dịka a na-ese okwu. Bịanụ ugbua ka anyị kwụsị agha a..."

Ebe foto si, Instagram/Obi Asika

Akụkọ kwuru na ọ bụ ya bulitere okwu "enweghi onye meriri, enweghi onye meriri" nke Gowon ji kwuo okwu oge agha Biafra biri.

Aha onyonyo,

'Esoro usoro iwu Naijirịa e nweghị ihe ndị Igbo ga-achịta

Ọrụ mwulite ala Igbo Asika rụrụ

  • Mgbe agha biri, Asika na ndị otu ya (gụnyere ndị agha Biafra agha na-erighi) malitere ọrụ nrụgharị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ebe agha mebichara, na-enweghi enyemaka akụ si n'ime ụlọ.
  • Site n'afọ 1970 ruo 1975, ha nyerela aka wulite ma rụgharịkwaa ọtụtụ kilomịta ụzọ n'ala Igbo
  • Ha rụgharịkwara ụlọakwụkwọ gụnyere Mahadum Naịjiria (UNN) dị na Nsụka
  • Ha rụrụ mahadum ọhụrụ dịka University of Nigeria Teaching Hospital dị n'Enugu (UNTH), Institute of Management and Technology (IMT), Alvan Ikoku College of Education dị n'Owere, dgz.
  • Ha rụgharịkwara ụlọakụ nakwa ebe nrụpụta ihe (industry) dị iche iche, nke nyerela aka iwulite azụmahịa mpaghara ọwụwaanyanwụ.
Aha onyonyo,

'Esoro usoro iwu Naijirịa e nweghị ihe ndị Igbo ga-achịta

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya

  • A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Juun 1936, n'obodo Barkin-Ladi dị na Platu steeti
  • A mụnyere ya n'ezinụlọ Edward Obiozor Asika na Rebecca Nwabunie Asika bụ ndị obodo Ogbeoza, Umuezearoli dị n'Ọnịcha, Anambara steeti

Ebe foto si, Ed Keazor

Nkọwa foto,

E chiri ya echichi Ajie Ukadiugwu nke Ọnịcha n'afọ 1985

  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị na St. Patrick's College dị na Calabar, mechaa gafee Edo College dị na Benin, n'afọ 1951 ebe ọ si gụchaa n'afọ 1955/56
  • A na-etu ya 'Don Ameche' mgbe ọ nọ n'ụlọakwụkwọ
  • Ọ rụrụ dịka onye ọrụ ndekọ nke bekee kpọrọ 'clerk' tupu ọ gawa ụlọakwụkwọ University College dị n'Ibadan n'afọ 1956 ruo 1960 ebe ọ nọ gụọ 'Economics'
  • O ritere nturugo 'nwa akwụkwọ kacha mee ọfụma' na mahadum ahụ
  • Ya na ndị a ma ama gụnyere Ukwu I. Ukwu, Emmanuel Ifeajuna, Uche Chukwumerije, Sam Agbam, J.P Clark nakwa Christopher Okigbo so gụọ Mahadum
  • Ka ọ gụchara na Naịjiria, o nwetara ikikere ịgụ akwụkwọ n'efu na mahadum University of California, Los Angeles (UCLA) ebe ọ nọ gụọ maka ndọndọrọ Ọchịchị (Political Science)
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Chinyere Edith Dibueze Asika (bụbu Ejiogu) n'afọ 1965; ha mụrụ ụmụ atọ

Ebe foto si, Uju Asika

Nkọwa foto,

Ukpabi Asika na nwunye ya, Chinyere

  • E nyere ya nturugo 'Commander of the Federal Republic' (CFR) n'afọ 2002
  • Ndị otiegwu a ma dịka Nze Dan Orji nakwa Soki Ohale biputara ọba egwu maka ya mgbe ọ nwụrụ
  • Ọ bụ onye nka na-amasị; o nwere ọtụtụ nka si na mpaghara dị iche iche n'ụwa
  • Ọ nwụrụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba, 2004, ka ọ rịachara ọrịa mkpọnwụ ahụ ọtụtụ afọ.

Ebe foto si, Obi Asika

Nkọwa foto,

Ukpabi Asika na Obasanjo oge e nyere ya nturugo CFR, Ukpaabi nọ n'oche ndị ọrụsị

N'ihi ụdịrị nnukwu mmadụ ọ bụ, mgbe ọ nwụrụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu gụnyere aka chịburu Naịjiria bụ Olusegun Obasanjo na Yakubu Gowon, LT Gen TY Danjuma, Martin Elechi chịburu Ebonyi steeti, Ọkammụta Pat Utomi, Sinetọ Evan Enwerem, Oriaku Maryam Babangida, Emeka Anyaoku bụbu onyeisi ụlọọrụ Commonwealth, Odeakwụkwọ Eddie Iroh na ndị ọzọ zitere ezinaụlọ ya ozi iti aka n'obi iji kwupute mwute ha.