Duncan Mighty: Ihere kwesịrị ime ndị gọvanọ niile na-achị mpaghara 'South-South' na 'South-East'

Duncan Mighty: Ihere kwesịrị ime ndị gọvanọ niile na-achị mpaghara 'South-South' na 'South-East'

Duncan Mighty bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa ekwuola na ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa enweghị ọgụgụ isi.

Nke a mere na ha amaghị ihe nwereike ime iji weta ọnọdụ enweghị ọrụ ndị ntorobịa n'isi njedebe.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'abalị Tusde, ma kwukwaa na ya "nwere atụmatụ nwereike ị na-ewebatara gọọmentị otu ijeri naịra (N1billion) kwa ọnwa".

Duncan Mighty, onye e ji 'Port Harcourt first son' nakwa 'Wene Mighty' mara, gara n'ihu kwuo na ịrụ okporoụzọ abụghị ihe gọvanọ kwesịrị iji na-eme ọnụ.

O kwuru sị: "Ọ jọgburu onwe ya na naanị ihe ndị gọvanọ ji etu ọnụ bụ ịrụ okporoụzọ."

"Mana ọtụtụ ndị ntorobịa nọ na-enweghị ọrụ, na-ebugharị egbe maọbụ na-eme yahoo yahoo."

"Ọ bụrụ na ndị ọchịchị nwere ọgụgụisi, naanị mpaghara 'entertainment' ezuola inye ọtụtụ ndị ntorobịa ezigbo ọrụ."

Nkọwa foto,

Duncan Wene Mighty Okechukwu

Lee ọkpụrụkpụ ihe ndị ọzọ Duncan Mighty kwuru na mparịtaụka a:

  • Ezigbo aha ya bụ Duncan Mighty Wene Okechukwu. Okechukwu bụ aha nna mụtara ya
  • Ọ bụ ndị ndị ntorobịa bi n'ime ogbe mmiri a na-akpọ 'creeks' nyere ya aha otutu ya bụ 'Port-Harcourt first son'
  • Burna Boy, Timaya, Omah Ley na ndị ọzọ si na Port Harcourt pụta egosila na ndị ntorobịa mpaghara ahụ nwere akaraka mara mma
  • Ọ bụ Duncan Mighty kpalitere mmasị iti egwu n'ime ndị na-eto eto na mpaghara anyị
  • Ọ bụ ihe ihere na ndị gọvanọ niile chịrịla mpaghara ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, onweghị onye nwere ọgụgụisi iji 'entertainment' wulite ndị ntorobịa.
  • Ọtụtụ n'ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa bụcha ndị ohi

Gbasara ndụ ya dịka mmadụ, o kwuru sị:

  • Ọ bụ Chineke zọpụtara m n'aka nwunye m nke ochie dịka o chọrọ iji ọgwụ jigide m
  • Anaghị m eche echiche ịlụ nwaanyị ọzọ ugbua
  • Ụmụ m etochaala, ọ bụghị taa ka m bidoro ịmụ ụmụ
  • Abụ m otu nwa. Naanị m ka nne m mụrụ
  • Nne m rịara ọrịa ịgba ọbara ihe karịrị afọ iri na asatọ, nke a mere na enweghị ụmụnne ndị ọzọ
  • Nna m so na ndị kwadoro m n'egwu a m na-eti ugbua, mana ọ dị mwute na ọ nọghị ndụ hụ oge ihe dịịrị m mma
  • Ugbua ana m arụ ụlọọrụ TV na Port Harcourt. Etinyela m ihe karịrị nde naịra narị ise (N500 million) n'ime ya

Gbasara ọchịchị Naịjirịa, o kwuru sị:

  • Ọ ga-aka mma ka Naịjirịa kewaa ka onye ọbụla gaa mezie ala nke ya
  • Onweghị mpaghara Naịjirịa ọbụla agụụ ga-egbu ma e kewaa obodo a
  • Ndị mpaghara Yoruba bụ ndị kacha nwee ọgụgụisi na Naịjirịa, n'ihi na ha na-akwalite ndị nke ha nke ukwuu
  • Ọgụ na esemokwu dị n'etiti Rotimi Amaechi na Nyesom Wike bụ ihe mwute na ihe ihere nye ndị Ikwere
  • Ikwere nwere gọvanọ nwee Mịnịsta, mana ha anaghị erite ha abụọ uru n'ihi esemokwu