Abia Steeti on red list: Ihe mere UK jiri tinye Abia n'ime steeti ndị si na mba ha ga-akpachara anya

Dịka ikpe Nnamdị Kanu na-kpụdebe nso, mba Briten agụnyela Abia dịka steetị ọnwụwa anyanwụ nke mbụ ga eso ndị ọzọ dịka ebe ndị mba ha kwesiri izere ma ha na-eme njem na Naịjirịa ugbua.
Ha depụtara nke a na websaịt mba UK n'ụbochị 16 nke ọnwa Ọktoba 2021.
Ebe foto si, Getty Images
Ozi a kwuru na a na atụ anya na ikpe a nwere ike ikpalite ngaghariịwe n'akụkụ mpaghara dị ịche ịche na ọnwụwa anyawụ Naịjirịa.
Nke a na-eso steeti ndị ha gụnyerela n'oge gara aga ndị mba ha kwesiri izere na Naịjirịa dịka Borno Steetị, Yobe, Adamawa, Gombe Steeti na ndị ọzọ dịka ha bụ ebe ọgbaghara kacha adapụta n'ala Naịjirịa ugbua.
N'ozi a si n'aka ngalaba "Foreign, Commonwealth & Development Office (FCDO)" nke mba Briten, ha kwukwara na ndị mba ha na-eme njem ga Naịjirịa kwesiri ịkpachapụ anya n'izu a dịka ọtụtụ otu na-akwado ime ncheta ngaghariịwe ndị ntorobịa mere n'ala Naịjirịa niile n'ọnwa Ọktoba nke afọ 2020 maka mmegbụ ndị uweojii nke a kpọrọ "End SARS".
Ha dọkwara ndị mba ha aka na nti ka ha zere ncheta ngaghariịwe a dịka ndị ọrụ nchekwa nwere ike ipụta n'igwe na Legos steeti nakwa n'Abuja maka ya bụ ngaghariịwe.
Chetakwa ozi ịdọ aka na nti gọọmentị Naịjirịa zipụtere n'Ọnwa Septemba mgbe ha debanyere mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'akwụkwọ mmee mmee gbasara enweghị nchekwa nke bekee na-akpọ 'red list'.
Nke a so ọgbaghara na nwakpoo niile dapụtara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'afọ 2021.
Lee ihe ise nwereike ime mpaghara Ọwụwa Anyanwụ e jiri banye na'red list'
Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ abanyela n'akwụkwọ mmee mmee gbasara enweghị nchekwa nke bekee na-akpọ 'red list'.
Nke a pụtara na onye ọbụla si mpaghara ọzọ chọrọ ime njem gaa Ọwụwa Anyanwụ kwesịrị ihi asaa n'anya.
N'ụbọchị Tuesday, Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steeti kwuru na ya bụ ihe ebutela nnukwu ọdachi nye mpaghara ala Igbo.
Kedu ihe nke a pụtara?
Ebe foto si, Presidency
Ụfọdụ ndị ndu mpaghara ala Igbo na onyeisiala Muhammadu Buhari na Osote ya bụ Yemi Osinbajo
Ihe ọ pụtara bụ na mba dị icheiche na-adọ ndị mba ha aka na ntị ka ha ghara ime njem gaa mpaghara ọwụwa anyanụ Naịjirịa.
Tupu ndị mba ọzọ agaa njem n'ala Igbo, ọ ga-abụrịrị ihe dị oke mkpa.
Ọzọkwa, tupu onye si mba ofesi agaa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, a ga-emerịrị atụmaụ nchekwa pụrụ iche nke bekee na-akpọ 'high risk assessment'.
Nke a ga-eme ka ndị oji ego achụ ego (investors) agaghị enwe mmasị ịbịa mpaghara ahụ bịa wuo ụlọorụ ha.
Ndị njem nlereanya (tourists) agaghịkwa enwe mmasị ịga na mpaghara ebe ndụ ha ga-anọ n'ụjọ.
Ihe dị otu a ga-eme ka ọnọdụ akụnụba mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-akụ afọ n'ala n'ike n'ike.
Mana gịnị kpatara ala Igbo jiri ghọọ ebe onye ọbụla na-atụ egwu ịga? Lee ụfọdụ n'ime ha.
1) Ndị na-achọ nnwereonwe
Ebe foto si, Getty Images
Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ
Tupu otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) apụta, e nweela ọtụtụ otu na-azọ ka mpaghara ala Igbo si na Naịjirịa kewara.
Mana kamgbe IPOB pụtara, ọzịzọ nnwereonwe a abanyela agba nke ọzọ.
Ọtụtụ oge ka ndị otu a na-enye iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ, nke a na-akpọ 'sit at home' na Bekee.
Ugboro ugboro kwa ka ha na-eme ngagharịiwe iji kwupụta ọchịchọ ha ka Naịjirịa kewaa.
Oge ụfọdụ, ha na ndị ọrụ nchekwa na-atakọrịta isi nke nwere ike ibute ọnwụ mmadụ.
Ihe dị etu a na-atụ ndị njem nakwa ndị oji ego achụ ego nnukwu egwu.
2) Oke ogbugbu mmadụ
Ebe foto si, Facebook/other
N'ọnwa Julaị, 'unknown gunmen' gburu Samuel Ndubuisi, onyeisi ụlọọrụ 'Scientific Equipment Development Institute' (SEDI), n'Enugu
N'ọdị nso a, ogbugbu mmadụ arịala nnukwu elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Ndị na-akpọ onwe ha 'Unknown gunmen' na-akpagharị ebe niile na-anapụ ndị mmadụ ndụ n'ike.
Site Enugwu, ruo Ọnịcha, banye Aba, sie ebe ahụ ruo Owere, banyekwa Abakiliki, otu ihe ahụ.
Ụdị ihe a anaghị aka onye ọbụla obi ka o mee njem bịa ala Igbo, maọbụ ka o hiwe ụlọahịa maọbụ ụlọọrụ ya n'ala Igbo
3) Mwakpo ụlọọrụ ndị nchekwa
Eeee awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo anyị ma gbuo inspector Peter - Onye Obodo Ojoto
N'ọdị nso a, ndị ekperima awakpola ọtụtụ ụlọọrụ ndị uweojii ka ndị ekperima wakporola, gbaa ya ọkụ.
Ọtụtụ ndị uweojii, ndị agha, na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche atufuola ndụ ha n'ihi mwakpo ndị a.
Ọ bụrụ na a na-awakpo ndị ọrụ ha bụ ichekwa obodo, kedụzi maka ndị nkịtị?
Ndị uweojii na-atụ aka na ọ bụ ndị otu IPOB na-eme mwakpo ndị a, mana IPOB na-ekwu na aka ha dị ọcha.
4) Nkwụsị na nnyocha ụgbọala ndị mmadụ n'okporoụzọ
Ogige ebe ndị uweojii na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala dị icheiche
N'ihi oke enweghị nchekwa, ọtụtụ ogige ndị ọrụ nchekwa juru n'ụzọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe a na-akwụsị ma na-enyocha ndị njem.
Nke a na-akpata oke kpachikpachi n'ụzọ ma na-eme ka njem too ogologo.
Onweghị onye na-eme njem nlegharị anya, maọbụ njem azụmahia ga-achọ izute ụdị ihe dị otu a.
5) Ụmụ kịrị ohi, aka n'akpa na otu nzuzo (petty crime/cultism)
Ebe foto si, Getty Images
Ịma aka n'akpa, ịnapụ ekwentị, izu ụmụ kịrịkịrị ohi na-arị elu na mpaghara ụfọdụ n'ala Igbo ugbua.
Ebe nke a kacha njọ dịka ọ bụ n'Ọnịcha, na mpaghara 'Upper Iweka'.
Ọtụtụ ndị mmadụ akọọla akụkọ etu ndị ekperima si napụ ha ihe ha n'ike na mpaghara ahụ.
Ị gaa na mpaghara Awka, ọ bụ otu nzuzo na-ewu ebe ahụ.
Ihe ndị socha ajụ ndị mmadụ obi oyi ịbịa mpaghara ala Igbo.