Sit at home: Ipob,ụnụ emeela were kagbuo atụmatụ a - Ohaneze

Ndigbo

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Amb. George Obiozor ekelela otu Ipob maka ịkagbu oku 'nọrọnụlọ'otu izuụka n'Ọwụwa Anyanwụ ma kpọọ ndị Anambara oku ka ha pụta n'igwe tụọ vootu na Novemba 6, 2021.

Ohaneze na, ndị okenye Igbo na ndị ndụ ụka rịọrọ otu Ipob ka ha kagbuo atụmatụ 'nọrọnụlọ' ha kwadoburu malite n'abalị ise ruo abalị iri nke ọnwa Novemba afọ 2021.

Ohaneze kwusiri ike sị na otu Ipob bụ ihe ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria kpatara ma kwuo na ya bụ ọgụ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị ka ndị ndu Ọwụwa anyanwụ kwenyere a ga-eji gboo ya.

Obiozor kpọrọ ndị Anambra oku ka ha pụta n' tụọ vootu n'abalị isii nke ọnwa Novemba.

Ọ gwara ha atụla egwu ndị ọrụ nchekwa jupụtara ka ma ha hụ ha dịka ndị ga-enye aka ịhụ na ihe niile gara nke ọma.

Ohaneze gara n'ihu kpọkụọ ndị orụ nchekwa ka ha rụọ ọrụ ha dịka n'ụzọ ziri ezi.

Simon Ekpa agbarụọla ihu maka etu Ipob siri kagbuo 'sit-at-home'

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook

Simon Ekpa bụ otu onye na-agbasa ozi maka nwereonwe Biafra n'ịntanetị agbarụọla ihu maka etu ndị isi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) siri kagbuo atụmatụ "sit-at-home" nke kwesiburu ịmalite taa bụ Fraịde ruo abali isii.

N'ihe onyonye o mere, Maazi Ekpa kwuru na dịka ọ bụ onye otu a, o ga-agwa ndị mmadụ ka ha rubere ya bụ nkagbu isi mana n'uche ya, na o kwunyeghiri ya bụ nkagbu ya mere o ji a si ka ndị mmadụ mee ihe kara ala Igbo mma nke bụ i ji aka ha nọrọ n'ụlọ gosi ọha ka obi dị ha maka nnwụchị Nnamdi Kanu.

Ọ kwukwara dịka ọ bụ ezigbo onye nsonso Nnamdi Kanu, na ị nọ n'ụlọ bụ ihe ọ che kacha mma.

Maazị Ekpa kwuru na ọ nabataghi ihe ndị ndu otu Ipob kwuru ebe ha si na iso ụzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ike ihazi ọgbaghara nọ n'ọwụwa anyanwụ.

O gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị ndu Ipob chọrọ iso ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị na ha kwupụta onye ga-abụ onye ọchịchị, ha kwupụta otu patị ha sonyere na ozi niile gbasara atụmatụ ndọrọndọrọ ọchịchị a ha na-ekwu na chọziri i so.

Agbanyeghi na ndị otu Ipob agwala ndị mmadụ pụta tụo voote n'ụbọchi Satọde, Maazị Ekpa kwuru ka mmadụ niile nọ n'Anambra hapụ ipụta tụọ vootu.

Ọ gara n'ihu kwuo na ime nke a bụ igosi na ha bụ ezigbo ndị nso nso Nnamdi Kanu.

Cheta na otu Ipob akagbuola atụmatụ nọrọ n'ụlọ ha nyeburu malite n'abalị Nọvemba 5 rue 10 ha tinyeburu.

Ọ pụtara ihe n'ime ozi ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Emma Powerful binyere aka n'ụbọchị Tọzde.

N'ime ozi ahụ Ipob kọwara ihe mere ha jiri gbanwe echiche ha banyere atụmatụ ịnọdụ n'ụlọ site ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba ruo abalị iri inke ọnwa ahụ.

Ha sị: "Dịka ndị okenye, ndị eze ọdịnala na ndị ndu ụka kpọrọ anyị, ndị isi Ipob nke onye ndu ya bụ Nnamdi Kanu akagbuola nọrọ n'ụlọ otu izụka kwesịrị ịmalite echi bụ Novemba 5-10, ọnwa Novemba afọ 2021.

"Anyị gekwara ntị na mkpu nke ndị nne anyị na-eti maka etu ha sị enweta nri ụbọchị nke ịnọ n'ụlọ nwere ike imetụtụta were kpebie ka anyị kagbuo ya.

"Ebe anya ndị ndu Ipob dị bụ na referadum nakwa nnwereonwe, ọ bụghị na ntuliaka.

"Ndị Anambra pụtanụ n'igwe tụọnụ Vootu n'abalị isii nke ọnwa Novemba."

"Ndị agha chọrọ inye aka mee nrụrụaka na ntuliaka Anambara"

Ipob gara n'ihu boo ebubo na ndị agha Naijiria chọrọ ịwụju ndị otu ha n'Anambara steeti iji mekpaa ndị mmadụ ahụ maọbụ gbuo ndị mmadụ boo ndị otu Ipob.

Ọ bụ ubọchị nke anọ nke ọnwa Nọvemba ka otu Indigenous People of Biafra (Ipob) nyeburu dịka oge ha sị ka gọọmentị Naịjirịa tụhapụ onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu maọbụ ha etinye atụmatụ onye nọrọ n'ụlọ nke Bekee kpọrọ sit-at-home.

Nkọwa foto,

Ndị ọrụ nchekwa juru Anambra maka nchekwa n'oge ntuliaka

Atụmatụ nọdụ n'ụlọ a Ipob sị na ha ga-amanye ga-amalite ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba.

BBC Igbo nụtara kepu kepu n'ụtụtụ ụbọchị ahụ ndi isi otu Ipob ga-eme nzukọ taa bụ Tọọzde iji mara ma atụmatu ahụ a ga-aga n'ihu.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị isi ha gbagotere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-arịọ ka Ipob ghara ịga n'ihu manye ịnọdụ n'ụlọ ahụ maka etu ọ ga-esi metụta ntuliaka a ga-eme n'Anambara Steeti n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ

Cheta na tupu gọọmentị Naijirịa e jide Nnamdi Kanu na mba Kenya ọ na-ekwubu na ya akadoghi ka emee ntuliaka n'Anambara.

Mana, ndị isi Ipob, nke Maazi Chika Edoziem nọ n'isi ha, ekwuola na ọnweghị oge ha jiri kwuo ka aghara ime ntuliaka n'Anambara.

Dịka ha si kọwaa, atụmatụ ịnọdụ n'ụlọ ahụ ga-amalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba, bụ ka tinye gọọmentị Naịjirịa ọkụ n'ike ka ha tụhapụ Kanu n'enweghị agbụ ekere ya.

Ka ha na-ekwu nke a, ọtụtụ ndị ama ama dịka ndị mgbasaozi Ipob na-ekwusike na ha akwadoghi ntuliaka n'Anambara.

"Nke a bụ ọgụ ikpeazụ"

Ndị mgbasaozi banyere nwereonwe Biafra dị ka Simon Ekpa, onye a ma na Facebook dịka Ikenga Uruagu, onye ama dịka Omote Biafra, na ọtụtu ndị ọzọ, na-agbasa ozi sị ka ndị mmadụ ghara ime ntuliaka n'Anambara.

Ebe foto si, Chika Edoziem/ Facebook

Nkọwa foto,

Chika Edoziem nọ n'etiti ndị Ipob ọzọ na Foto a

Nke a na-abịa dịka Chika Edoziem gwara ndị mgbasaozi Ipob ka ha gbasie ụkwụ ha n'ala n'ike dịka ọ sị "nke abụ ọgụ ikpe azụ.

Ọ bụ na mgbasaozi Maazị Edoziem mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba.

Ebe Ikpe Kanu nọ ugbua

Gọọmentị Naịjirịa na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo na ọ na-akpa nkata imegide Naịjirịa nakwa ebubo isii ndị ọzọ.

A ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba maka ebubo a, ebe eyigharịrị nke Ọkaiwu Aloy Ejimakor tinyere n'ụlọikpe n'Ụmụahia maka "mmegide ikike dịrị Nnamdi Kanu".

Oke ọgbaghara na ogbugbu mmadụ ka a na-arịa ugbua n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke gụnyere Anambara Steeti.