World Disability Day: Lee etu nwa ada a jiri bụ 'nwaanyị kpuruisi mbụ nwetere PhD na Naịjirịa'

World Disability Day: Lee etu nwa ada a jiri bụ 'nwaanyị kpuruisi mbụ nwetere PhD na Naịjirịa'

Nwada Ifeoma Bibiana Okoli so na ndị gụchara akwụkwọ n'ogogo 'doctorate' na mahadum 'Univeristy of Ibadan' (U. I)mana ihe mere o jiri gbapụ iche bụ na o kpuru isi.

Ya bụ onye mbụ kpuru isi nwetara asambodo 'PhD' na University of ibadan nakwa n' obodo ya dị Anambara steeti.

Nwaafọ Eziehu, Ihu Akaba Igboukwu dị n'Okpuru Ọchịchị Aguata n' Anambara steeti gwara BBC Igbo ihe ndị ọ gabigara mgbe ọ na-agụ akwụkwọ dị ka onye kpuru isi nakwa etu o si merie ma bụrụ onye gụcharala akwụkwọ.

Okoli sị na o kpughi isi mgbe a mụrụ ya kama nọ bụ oge ọ dị afọ asaa ka nne ya chọpụtara na o nwere ọrịa anya.

"Nne m chọpụtara na anaghị m edezi ihe n'akwụkwọ ọfụma dịka o kwesịrị, o jụọ maka gịnị m wee sị na na anaghị m ahụzi ihe ahụ anya ọfụma".

"Mgbe ahụ ka e buru m gawa n'ụlọọgwụ bụ ebe a malitere ịtanye m ọgwụ n'anya."

Okoli sị na o nweghi ndị chọpụtara ihe mere ya kpọmkwem rute ugbua.

Kirie ihe ndị ọ kọwaara n'uju;