World Disability Day: Ọrụsị m na-emebu m ihere, mana ugbua Ọtụtụ ụmụ nwoke na-arịọ m ọyị - Chidimma Ajemba

World Disability Day: Ọrụsị m na-emebu m ihere, mana ugbua Ọtụtụ ụmụ nwoke na-arịọ m ọyị - Chidimma Ajemba

Ndụ Chidimma Ajemba gbanwere oge ndị ọrụ ahụike ji ntụtụ gbajie ya ụkwụ oge ọ bụ nwata.

Nke a mere ya ka ọ bụrụ onye ọrụsị, nke na-eji igwe bekee kpọrọ 'wheelchair' akpagharị.

N'akụkọ ọ kọọrọ BBC Igbo, o kwuru na ọrụsị ya na-emebu ya ihere.

Mana ugbua, ọtụtụ ụmụnwoke na-ayọzi ya ọyị n'ihi etu o si gbanwee ọrụsị ya ka ọ bụụrụ ya ihe mbuli elu.

Abalị atọ nke ọnwa Disemba ọbụla bụ ụbọchị ncheta ndị ọrụsị nke a kpọrọ 'World Disability Day' na bekee.

Akụkọ Chidimma Ajemba na-egosi na mmadụ inwe ọrụsị abụghị njedebe ndụ ya.