Etụ esi tọhapụ Igwe Mbutu na Aboh Mbaise

Aboh Mbaise

Ebe foto si, Olaniyan Olushola

Akụkọ na-eru anyị ntị n'ụtụtụ Satọde a bụ na atọhapụla Igwe Damian Nwigwe bụ onye ndị ekperima ji kemgbe Tọzde ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba 2021.

Ozi a si n'aka Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Michael Abatam bụ onye kwụrụ nke a n'ụtụtụ taa bụ Satọde.

Ndị uweojii na-akọwa na ahapụrụ ya bụ Igwe na-enweghị nsogbu ọbụla.

Diokpara ya bụ Igwe bụ Magnus Nwigwe kwere na a hapụla nna ya ka ha kwụchara ndị ntọ ahụ ụgwọ.

Mgbe BBC na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ekwentị ka aka ndị uweojii adị na ntọhapụ nna ya, ọ zara "odoghị m anya ka aka ndị uweojii adị na ntọhapụ nna m. Kedụkwanụ ka aka ha sị dị na ya ebe anyị kwụrụ ụgwọ ndị ntọ sị anyị kwụọ tupu atọhapụ ya?".

O kwukwara na ọ bụ ndị ntọ ahụ gwakwara ha ebe ha ga-aga buru ụgbụọala nna ya mgbe mbụ ha kpọọrọ ya.

Magnus kwukwara na "ọnwebeghị ndị anyị na-enyo aka ha dị na ntọrị a mana anyị na-eche na ọ bụ maka ọnọdụ nna m dịka Igwe obodo anyị butere ya bụ ekworo".

Igwe Nwigwe nọ n'aka ndị ntọ abalị abụọ tupu a tọhapụ ya.

Etu ndị ekperima si tọrọ Igwe ndị Mbutu, Aboh Mbaise, Damian Nwigwe

Ndị ekperima amabeghị ndị ha bụ atọrọla eze ọdịnala ndị obodo Mbutu nke dị n'Aboh Mbaise, Imo Steeti.

Ọ bụ n'isi ụtụtụ taa bụ Tọzde ka nke a na-eme dịka ndị obodo ahụ si kọọrọ BBC Igbo.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam gwakwara onye ntaakụkọ anyị na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.

Onye obodo Mbutu gwara anyị okwu kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ndị ntọ tọọrọ Eze anyị bụ Damian Nwaigwe n'obi ya, n'ihe dịka elekere abụọ na ọkara nke ụtụtụ taa bụ Tọzde."

"Ndị ekperima ahụ bu ọtụtụ ụgbọala oge he wakporo eze anyị."

"Ha mechiri okprpụzọ e si abanye n'obi ya, ma na-agba egbe aghara aghara."

Onye ahụ kwuru na ebe Eze ha rụrụ ụlọ ya dịpụrụ iche n'ebe ndị mmadụ bi, ọ bụ ya mere o ji dịrị ndị ekperima ahụ mfe ịwakpo ụlọ ya.

Oge BBC Igbo kpọtụụrụ ndị uweojii Imo steeti, Michael Abattam kwuru na ha amalitela ọrụ iji chọta ma zọpụta eze ahụ.