Imo Traditional Ruler Killed: Etu ndị ekperima si gbuo Eze Atta, Njaba ma tọgbọ ozu ya n'ahịa

Ụgbọala Eze Edwin Atta

Ahụla ozu Eze Edwin Azike onye bụ eze ọdịnala ndị obodo Atta, nke dị n'okpuru ọchịchị Njaba n'Imo steeti.

A chọtara ozu Eze Azike n'ime ahịa obodo ha ebe ndị gburu ya tọgbọrọ ya.

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde ka ndị ekperima tọọrọ Eze ahụ n'ụlọ ya, mana onweghị onye ma ebe ha kpụ ya gawa.

Mana ọ bụ taa ka a hụrụ ozu ya n'ahịa

Onyeisi otu jikọrọ ndị eze ọdịnala n'Imo steeti bụ Emma Okeke, gwara onye ntaakụkọ anyị na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.

Eze Emma Okeke kwuru sị: "EE anyị nụrụ ya bụ akụkọ ọjọọ. Anyị nụrụ na a tọọrọ ya ụnyaahụ mana a hụrụ ozu ya taa."

"Ihe a bụ nnukwu arụ n'omenala Igbo."

"Anyị amaghị ihe kpatara ndị ekperima ji achụgharị ndị eze."

"Anyị abụghị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ọrụ anyị bụ ichekwa ọdịnala obodo anyị."

Oge BBC kpọtụụrụ ndị uweojii Imo steeti, ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam, kwuru na ya anụla akụkọ ahụ, mana ọ na-eche ka onyeisi ndị uweojii na mpaghara Njaba wetara ya ozi gbasara ihe merenụ kpọmkwem.

Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka akpọpụta aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ekperima ahụ gbagburu mmadụ anọ oge ha wakporo ma tọrọ eze ahụ n'ụbọchị Tọzde.