Electric Generator: Igwe ọkụ anyị rụrụ anaghị eme ụzụ maọbụ ịsụ anwụrụ
Electric Generator: Igwe ọkụ anyị rụrụ anaghị eme ụzụ maọbụ ịsụ anwụrụ
Henry Obasi bụ onye aka na-aghọ nkọ n'ịrụpụta akụrụngwa teknụzụ dị iche iche kọwara etu igwe ọkụ latrik ọ rụrụ jiri dị iche na nke ndị ọzọ.
Na nkọwa o nyere BBC Igbo, Obasi kwuru na ọ naanị akụrụngwa atọ ka o jiri rụọ igwe ọkụ ya nke gụnyere 'battery, d.c coil, a.c motor na brain box.
Ọ sị na igwe ọkụ a anaghị e ji mmanụ ụgbọala maọbụ ikike si n'anyanwụ bụ solar energy arụ ọrụ, na ọ naghị asụ anwụrụ ọkụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Obasi sị na ebumnobi ya imepụta igwe ọkụ a bụ ka o rute onye ukwu maọbụ onye nta aka kama na ọ bụ na ego adịbeghi ịrụpụta ya ebe o buru ibu.
Kirie ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju;