Nnamdi Kanu Latest: 'Ndị DSS mịrị ọbara Nnamdi Kanu ihe karịrị ugboro iri abụọ' - Maxwell Opara

Ebe foto si, Maxwell Opara
Ụlọọrụ Department of State Security agọọla ebubo mmekpa ahụ megidere Nnamdi Kanu nke ọkaiwu Kanu boro ha.
DSS gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Tuesday (December 14, 2021) na ọkaiwu Kanu ji ya bụ ebubo achọ ihụọma n''ihu ọha.
Ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afụnanya kwuru na Nnamdi Kanu na-ebi ọfụma n'ụlọmkpọrọ n'agbanyeghị na ndị ọkaiwu na-atụ asị na DSS na-emekpa ya ahụ.
O kwuru na okwu na agụụ na-ahịọ Kanụ ọnụ na mkpọrọ ha bụ asị makana ọ na-eri nri gụrụ ya.
Afunanya kwukwara na Kanu na-agbanwe akwa o yi n'ahụ n'agbanyeghị okwu ụgha ndị Ipob na-ebugharị na Kanu anaghị agbanwe uwe ya.
O kwuru na ruo ugbua, ndị ọkaiwu Kanu ekwubeghị ihe mere kpọmkwem ha ji chọọ ka akpọrọ ya gawa ụlọmkpọrọ Kuje.
Nnamdi Kanu Umahia: Etu ikpe ya si ga n'ụlọikpe taa
Ọsịsa DSS na-abịa dịka ọkaiwu Kanu kpụpụrụ ha ụlọikpe ukwu dị n'Abuja maka ebubo imekpa Kanu ahụ ka ọ nọ na ụlọmkpọrọ DSS.
Ihe Nnamdi Kanu gwara anyị DSS na-eme ya ọhụrụ a- Ọkaiwu Maxwell Opara
Maxwell Opara onye bụ otu onye n'ime ndị ọkaiwu onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agbaala otu ndị uweojii pụrụiche a na-akpọ Department of State Services (DSS) akwụkwọ ọhụrụ.
Opara gwara BBC Igbo na ọ bụ Nnamdi Kanu gwara ya na nwanne ya nwoke bụ Emmanuel Kanu ihe ndị a o kwuru na DSS na-eme ya n'ụlọ mkpọrọ ha mgbe ha gara ileta ya n'ụbọchị December 9, 2021.Sịte n'akwụkwọ ozi Maazị Opara zipụtara n'ụbọchị Mọnde, lee ebubo niile o boro ụlọọrụ DSS ọhụrụ a.
- O kwuru na ha kpọtara otu dọkinta mịrị ọbara Maazị Kanu ruo ugboro iri abụọ na otu.
- O si na agbanyeghi nke a, ha ekweghi Maazị Kanu hụ mpụtara nyoocha imeahụ ha ji ọbara ya eme.
- O kwuru na Kanu na-eche na ya bụ dọkịnta bụ nke adụgboroja.
- Maazị Opara kwukwara na usoro a ezighi ezi ezi ma kwuo na ndị DSS ekwebeghi gee ntị n'ihe Binta Nyako onye bụ ọkaikpe nọ n'isi ikpe a kwuru ka ekwe ka Maazị Kanu nweike igbanwe akwa ya ma nwee ohere ikpe okpụkpere chi ndị Jụụ bụ okpụkpere chi ya.
- Ozi ya kwuru "Ha na-akwụ ya agụụ, ha anaghị ekwe ya jrii ego ya zụrụ ihe ọ chọrọ, ha anaghi ekwe ka o rie nrị ọ chọrọ ọ kachasi nri ka enyere ahụike ya aka"
N'ikpe ọhụrụ a, ọkaiwu Opara rụrụ onyeisi ndị DSS bụ Yusuf Bichi aka ma rụkwa ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami aka dịka ndị ha na-eche ka ha zara ọnụ ha n'ebubo a. Cheta na ndị ọkaiwu Maazị Kanu eboola ndị ụlọọrụ DSS ebubo ole m ole banyere aka ike na mmekpa ahụ ha ji eso ya n'oge gara aga.
Nke gụnyere ebubo ibu ọnụ, igbochi ndị ọkaiwu ya na ndị ezinaụlọ ya ilete ya, igbochi ya igbanwe akwa ya, igbochi ndị ọrụ ahụike ya ilete ya wdgz.