African Eye: BBC enyochapụtala otu onye APC bụbu onyeisi otu nzuzo 'Black Axe'
African Eye: BBC enyochapụtala otu onye APC bụbu onyeisi otu nzuzo 'Black Axe'
Ndị 'Black Axe' bụ otu nzuzo a na-ebo ebubo igbu ọchụ na nrụrụaka, abaala ọtụtụ ọkwa ndọrọndọ ọchịchị na Naịjirịa ma malite mpụ na igwu ndị mmadụ chandum na mba ofesi, dịka ọtụtụ akwụkwọ mgba ama si gosi.
Black Axe nọ na Naịjirịa kemgbe ọtụtụ afọ, dịka ha so n'ime otu nzuzo ndị gọọmentị machiri na mba ahụ.
Kemgbe afọ abụọ gara aga, BBC African Eye na-ama imi n'ala na-enyocha otu Black Axe, na-ajụ ndị bụbu ndị otu ha ajụjụ ma na-enyocha puku kwuru puku akwụkwọ ndị mmadụ nwetere n'aka ụfọdụ ndị otu ahụ.
Lee ụfọdụ ihe BBC nyochapụtara.