Ipob news today: Ihe ụlọikpe kpebiri maka ụmụokorobịa a nwụchiri n'Emene

Ụmụntorobia a tọhapụrụ n'Emene

Ebe foto si, Barr Ifeanyi Ejiofor

Ụlọikpe atọhapụla ụmụokorobia atọ a nwụchiri mgbe ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị uweojii na ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) n'ọnwa Ọgọst afọ 2020.

Ụlọikpe ukwu dị n'Enugwu steeti nyere iwu n'ụbọchị taa bụ abalị 14 nke ọnwa Disemba 2021, ka a hapụ ụmụokorobia atọ a ka ha lawa.

A nwụchiri Paul Okafor, Ede Friday Emmanuel na Ojiude Joseph Anayo n'ụbọchị 23 nke ọnwa Ọgọst 2020, n'ebubo igbu mmadụ, oge ihe a kpọrọ 'Emene Massacre' nọ na-ewu.

Dịka Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu ndị Ipob nakwa nke Nnamdi Kanu si kọwaa, ọkaikpe nọ n'elu ikpe ahụ achọtaghị ihe ọbụla gbasara igbu mmadụ n'aka mmadụ atọ ahụ, mere o ji sị ha lawa.

Cheta na ọgbaghara dapụtara n'etiti ụfọdụ ndị ntorobịa Ipob na ndị uweojii n'Emene, Enugwu steeti n'ọnwa Ọgọst 2020, mgbe ndị uweojii wakporo ebe ndị Ipob na-eme ọgbakọ wee chụsasịa ha.

Ya bụ ọgbaghara butere mmerụ ahụ ụfọdụ ndị mmadụ, ebe ọgbaghara sochiri ya takwara isi ndị mmadụ.

Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ hụrụ ozu otu onye na-agba ọkụ ebe ahụ ụbọchị ahụ ihe ahụ mere.