Daddy Showkey: Akụkọ ndụ m si wee bido n'okoro ụzọ

Daddy Showkey: Akụkọ ndụ m si wee bido n'okoro ụzọ

Onye oti egwu a ma ama bụ John Odafe Asiemo a na-akpọkwa ‘Daddy Showkey’ akọwaala etu o siri too ma malite iti egwu bụ nke e ji mara.

Na mkparịụka ya na BBC Igbo nwere, Showkey sị na ndụ ya gbanwere oge nna ya nwụrụ maka ya na nna ya dị na mma nke ukwuu.

Ọ sị mgbe ọbụla nna ya bịara Legọs kwa ụbọchị ụka ọbụla, na ha abụọ ga-eyi uwe ọhụrụ yiri ibe ha ma soro gaa n’ụlọụka.

Ọ sị na oge aṅụrị ahụ anọteghi aka wee bịa na njedebe n’ihi ọnwụ nna ya.

Daddy Showkey

Ebe foto si, Daddy Showkey

Nkọwa foto,

Daddy Showkey na nne ya Florence Asiemo

“Nne m agwaghị m na nna m anwụọla, abịara m hụ na ọ kwụsịrị ị na-abịa dịka o si eme na mbụ.

“Iji mee ka m ghara ịmata, nne m gara n’ihu na-akwara m uwe ọhụrụ kwa ụbọchị ụka ọbụla.

“Otu ụbọchị a nụrụ ka nne m na-ebe akwa na-akpọ aha nna m, ozugbo ahụ a chọpụtara na ọ nwụọla.

Nne m amaghị na ihe ahụ mere m jiri hapụ ụlọ gbaa ọsọ gbaga n’okporo ụgbọoloko dị n’Ijora Legọs.”

Daddy Showkey

Ebe foto si, Daddy Showkey

Nkọwa foto,

Daddy Showkey na enyi ya nwoke mgbe ha pere mpe n'Ajegunle. Legọọs, Naịjirịa

Showkey sị na ọ bụ nnenne ya chọtara ya ma kpọlata ya n’ụlọ, mana ndị enyi ya sokwa ya lọta.

Ọ sị na o bidoro mụtawa ke e si akụ ọkpọ (boxing) mana o nweghi onye enyemaka ga-ebinye aka n’akwụkwọ ka ọ gaa n’ihu.

Ọ sị na o mechara soro ndị nka na egwu, wee na-eme ndị mmadụ obi aṅụrị dịka ha na-ekiri ya.

Daddy Showkey kọwara ka o si bipụta egwu ya nke mbụ nakwa etu ezinaụlọ ya si kpeere ya ekpere ọganihu ma kwado ya.

Daddy Showkey

Ebe foto si, Daddy Showkey

Nkọwa foto,

John Odafe Asiemo nke a na-akpọ Daddy Showkey

Onye bụ Daddy Showkey?

  • John Odafe Asiemo a maara dịka Daddy Showkey bụ onye a ma ama dịka ọgụ egwu nke a kpọrọ "ghetto reggae".
  • A mụrụ ya n’ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst afọ 1970.
  • Ọ bụ onye Olomoro dị n’okpuruọchịchị Isoko South nke Delta Steeti mana a mụrụ ya n'Ajagunle Legọs bụ ebe o toro.
  • E jiri egwu ya o bipụtara n'afọ 1995 bụ ‘welcome’ mara ya.
  • Daddy Showkey bụ onye gosipụtara egwu a na-agba masịrị imirikiti mmadụ nke a kpọrọ ‘galala’.
  • Site mgbe ahụ o bipụtara akwụkwọ egwu karịrị atọ n'aka Feline records.
  • Ọ lụrụ nwunye aha ya bụ Ebere Asiemo, ma mụta ụmụ anọ; nwoke abụọ na nwaanyị abụọ.
  • Nwunye ya bụ onye Ikwuanọ dị n'Abịa steeti
  • Showkey na-asụ asụsụ ise; ha bụ Bekee, Pidgin, Isoko, Igbo na Yoruba.
Daddy Showkey na nwunye ya

Ebe foto si, Daddy Showkey

Nkọwa foto,

Daddy Showkey na nwunye ya

Site na mgbe o bipụtara ọpụrụiche egwu ya, ma nke a na-agba agba bụ galala, ọtụtụ ndị ọgụụ egwu ọzọ helitere isi ma bido iṅomi ya n'egwu nke ya.

Na mkparịụtaụka a, Showkey tinyekwara ọnụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ntoroọbịa, Ipob na ihe ndị ọzọ.

Kirie ihe onyoonyo a n'uju.

Ndị mere akụkọ a: Olufemi Gabriel, Adline Okere na Vining Ogu