Ezza Effium crises in Ebonyi State: Anyị gụtara ozu mmadụ 26 na ndị e gburu n'obodo Ezza,
Ndị obodo na-asụ asụsụ Ezza akwaala arịrị maka ogbugbu a sị ndị obodo Effium gburu ọtụtụ ezinaụlọ n'obodo ndị a n'ụbọchị Sọnde 10 Eprel, 2022.
BBC Igbo gara obodo ndị a, otu nwoke hụrụ ka o si mee sị ihe a mere n'isi ụtụtụ mgbe ndị Effium a batara obodo ha ma bido igbu ndị mmadụ nakwa ịgba ọtụtụ ụlọ na ngwongwo ụlọ ọkụ.
Ọ sị na ozu ndị mmadụ ha hụrụla karịrị iri abụọ na isii (26) ebe ụlọ ndị e mebiri ruru iri na asaa (17).
Ọ sị na ọ bụ eziokwu na ha na ndị a nọ n'ọgụ mana gọọmentị nyere iwu sị ka a kwụsị ọgụ bụ nke ha ṅara ntị na ya.

Mana ha amaghị na ndị a ga-eji etu a bịa wakpoo ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị kpara arụ a ruru otu narị n'ọnụọgụgụ, na ha si n'akụkụ obodo Ogbabruagu gbuo mmadụ anọ, gbuo mmadụ anọ ọzọ n'Ebiaji; mmadụ anọ n'Ogbaenyigwe bịazie n'Ebbeta gbuo mmadụ isii.
Ọ sị na ndị a gaziri n'obodo Izzi ma gbuo mmadụ asatọ gbaa ọtụtụ ụlọ karịrị iri na asaa ọkụ ma ụgbọala.
Ọ sị na ndị a malitere mwakpo n'elekere isii nke ụtụtụ megide ya ruo elekere abụọ nke ehihie tupu ndịagha Naịjirịa na-erute ha alaala.
Ihe ndị uweojii na Gọomentị kwuru?
Kọmishọna ndị uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Garba Aliyu sị na ọ natara ozi maka ogbugbu ndị a ma zipu ndị ọrụ ya ebe ahụ.
Ọ sị na ọ na-eche ka ndị otu ya bata bịa gwa ya nke bụ eziokwu banyere akụkọ ahụ.
N'aka nke ọzọ, Onyeisi oche Okpuruọchịchị Ohaukwu dị n'Ebonyi Steetị bụ Clement Odah katọrọ mwakpo ahụ.
Ọ sị na ha ga-agba mbọ isi imi n'ala ma chọpụta ndị kpara arụ a.
Odah gara n'ihu tie ezinaụlọ ndị a e gburu aka n'obi ma sị na gọọmentị na-agba mbọ iwete ude n'etiti obodo ndị a.
Kedụ etu esemokwu Ezza na Effium si malite?

Ntọala esemokwu dị n'etiti obodo abụọ a maliitere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, mgbe ha na-azọ onye ga-abụ onyeisi ọdọụgbọala (park) Ohaukwu.
Nke a butere ọgụ, ogbugbu ndị mmadụ nakwa ịgba ụlọ na ngwongwo ụlọ ọkụ n'ime obodo ndị a.
N'ihi nke a, e gbuola ọtụtụ ndị mmadụ ma mebie ngwongwo rurula ọtụtụ nde naịra.
Ndị Effium si na Benue Steeti bu ụzọ biri n'obodo ahụ mana ha rịọrọ ndị Ezza bịa nyere aka n'oge agha, kwee ngwa na ha ga-ebikọta ọnụ ma ọ gụọ ahụ bie.
Ha malitere ibikọ ọnụ ma na-alụkwa ibe ha rute mgbe esemokwu a malitere n'afọ 2021.
Gọomentị Ebonyi agbaala mbọ emezi esemokwu dị n'etiti obodo abụọ ndị a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: